Premier League table: Chelsea na Manchester United azọọla Leicester City ụkwụ n'isi wụfere

Ebe foto si, Getty Images/EPA
Manchester United na Chelsea ga-eso agba Champions League nke afọ 2020/2021 dịka Premier League nke afọ a pịachiri taa.
Goolu abụọ asataghị otu Man Utd ji merie Leicester City, na abụọ asataghị otu Chelsea ji merie Wolves, mere ka nke a dị ire.
Man Utd pịachiri afọ a n'ogogo atọ na tebulu, ebe Chelsea gbazịrị onye anọ.
N'agbanyeghi na ha abụọ nwechara pọịntị 66, Man Utd ji ndịiche goolu gafere ha.
Ndị nyerela Man Utd goolu bụ Bruno Fernandes ji penariti VAR kwuru na ọ dabara, nye goolu na nkeji 71, tupu Jesse Lingard emezuo ya abụọ na nkeji 90 na ụma.
Ebe Mason Mount nyerela Chelsea goolu nke mbụ na nkeji 45. tupu Olivier Giroud atụkwasị ya nke abụọ na nkeji 45 na ụma.
Lee etu e si kwụrụ n'ahịrị na tebulu Premier League mgbe a pịachiri taa.

Ebe foto si, Empics

Jamie Vardy nyere goolu 23 na Premier League n'afọ a, nke mere ka ọ bụrụ onye ritere akpụkpọụkwụ olaedo a na-enye onye kacha nye goolu n'otu afọ.
Nke a mere Vardy dị afọ 33 onye kacha kaa nka riterela nturugo a.
Ederson nke Manchester City ritere mgbanaka ọlaedo dịka a na-enyeghi ya goolu n'egwuregwu 16 n'ime 38 a gbara.











