Ndị uweojii a na-anwụchi ụmụ okorọbịa Nnewi n'ụzọ ezighi ezi?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụfọdụ ndị bi na Nnewi dị na Anambara steeti na-eti mkpu na ndị uweojii ahapụla ọrụ ha na-achịkọ ụmụ ikoroọbịa na-agara onwe ha n'ọnọdụ na ha na anwụchị ndi otu nzuzo.

O teela aka akụkọ na-apụta maka ndị ụweojii pụrụiche a kpọrọ "Anti-cultism" n'Anambra steeti na-aga be ndị mmadụ n'ime abalị anwụchi ụmụ nwoke ntorọbịa bi ebe ahụ.

Cornel Osigwe, bụ onye Nnewi gwara BBC na nsogbu ndi uweojii na-enye ka nkụ na Nnewi.

"Ndi uweojii na-abịa nwụchịe ụmụ okorọbịa ma manye ha ịsị na ha bụ ndị otu nzuzo. A na-akpa ha aka, nke mere ị ga-agbapụta ha, ị hụ ihe onyonyo ka ha na-ekwu na ha bụ ndi otu nzuzo."

Ọ sịkwa na ndị uweojii na-ana ha ego tupu agbapụta ndi ha ji.

"Ha na-asị ka a kwụọ otu puku narị naịra."

Osigwe sị na ya epesarala ọtụtụ mmadụ banyere ihe a mana onwebeghi ihe mere.

Ọ bụghị kwa naanị na Nnewi ha nke a na-eme, ụfọdụ mmadụ bi ebe ọzọ ekwuola otu ihe a kwa.

Ifeanyi kọrọ akụkọ etu ndị uweojii sir nwụrụ ụmụ nwanne ya nwoke ndị obere n'etiti abalị n'Enugwu ukwu dị n'Anambra steeti.

Mgbe BBC jụrụ ya ase ihe na-eme, o kwuru na agbapụtala ndị ahụ n'aka ndị uweojii boro ha ebubo ịnọ n'otu nzuzo.

"Nna m kwụrụ puku naịra iri isii iji gbapụta ha n'otu ụbọchị ahụ" ka o kwuru.

Osigwe sị na ụdịrị ihe mekwara n'obodo Umudim.

"Ha bara be Obi Umudim, ga kpụrụ nwa ya nwoke."

"Nwa obi na Nnewi metere ihe eji nwụchịe ya"

Dịka ndị gwara BBC okwu siri kọwa a, otu onye ndị ụweojii pụrụiche a kpọrọ "Anti-cultism" n'Anambra steeti nwụchịrị bụ nwa Obi na mpaghara Nnewi

Ndị gwara BBC okwu n'ekwentị na-ekwu na ndị uweojii a pụtara n'etiti abalị, gaa be Obi ahụ, mebisie ihe dị icheiche ma nwụchie nwoke ahụ.

Nke a bụ nkọwa akụkọ mere n'ezie dịka kepu kepu na-efegharị na-ekwubu na ọ bụ ndị ntọ tọọrọ nwaokorọbịa ahụ.

Mana ọnụ na-ekwuchietere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed kọwara na ọ bụghị ihe e chere mere.

O kwuru na nne otu okorọbịa bịara kpesara ndị uweojii maka nwa Obi ahụ na ọ naara ya ekwentị ya ma majaa ya.

Ọ sị na ọ bụ nke a mere eji gaa ịnwụchie nwa Obi ahụ n'ihi na-echeere na ọ nọ n'otu nzuzo.

Mohammed kwukwara na mgbe a gara ịnwụchi ya na ndị ntọrọbịa obodo ahụ malitere ịlụso ndị otu ya ọgụ.

"Anyị nwụchiri mmadụ atọ n'ihe a mere, anyị ka na-agba mbọ ịchọta onye wụ onye isi ha" ka o kwuru.

Mohammed sị na okwu na ndị uweojii na-edo ndi okorọbịa na Nnewi abụghị eziokwu.