Violence by stabbing: 'Echere m na m gaara anwụ mgbe a sụchara m mma ugboro 12'
Peter Molokwu bi na mba ofesi a sụrụ mma ugboro iri na abụọ kọwara ihe ọ gabigara n'ọnụ ọnwụ dịka ọ nọ n'ụlọọgwụ.
Ọ sị nọ bụ otu nwoke ya na ya nweburu esemokwu wakporo ya n'ụlọọrụ ya ma were mma sụkasịa ya ahụ, ihe ruru ugboro 12.
O kwuru na mgbe nke a mere na o maghị na ọ ga-adị ndụ ọzọ na ezinaụlọ ya chere na ọ nwụọla.
Molokwu sị na ahụ ọ merụrụ dị ukwu nke mere ka ndị dọkịta chee na ọ ga-anọ ụlọọgwụ ihe ruru ọnwa isii.
Kirie ihe o kwuru n'uju:
Akụkọ ndị ga-amasị gị: