Ike Ekweremadu: Ihe mere na okwu 'infectious Disease Bill' agaghị enwe isi

Ike Ekweremadu bụbu osote onyeisi Sinetị Naịjirịa ekwuola na gọọmentị etiti enweghi ikike ịkpachi ego gọọmentị Steeti.

Ekweremadu, kwuru nke a oge ya na 'Dream FM' dị n'Enugwu nwere mkparịtaụka taa bụ Fraide n'ọsịsa ntuziaka ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami nyere sị na a ga-akpachi ego steeti ọbụla nupuru isi n'iwu nnwereonwe ụlọomeiwu steeti nke Onyeisiala muhammadu Buhari binyere aka na nso nso a.

Ọ sịrị na "Ha enweghị ụdị ike ahụ" ịnapụ steeti ego ma ha nnụpụ isi na iwu nnwereonwe ụlọomeiwu steeti nke onyeisiala Buhari tiri.

Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:

Ọchịch onye kwuo uche ya n'afọ 21

Nke a bụ oge kachasị too ogo e nwerela ọchịchị ndị agbada. Ọ dị mkpa na anyị kwadoro ya ka ọ tọọ atọ.

Akwụkwọ iwu maka ọrịa na-na-efe efe(Infectious Disease Bill)

Ekweremadu kwuru na akwụkwọ iwu a medigere iwu ala anyị dịka o nye gịghị mmadụ ikike ịga ụlọikpe gbaa ebubo e boro yaọ sị gbasa ikike ịga ebe masịrị gị,inwe ụlọ maọbụ ala."

Ọ sị,"Ọ dịghị ka akwụkwọ iwu maka ọrịa na-efe efe(Infectious Disease Bill) etu o si dị ugbua aga aghọ iwu n'ihi na ọtụtụ ndị omeiwu anabataghị ya."

"Ọ dị m ka akwụkwọ iwu ahụ dị egwụ karịa ọrịa na-efe efe a chọrọ iji ya gbochie."

Nsogbu Coronavirus wetara n'ọchịchị

Iwu ala Naijiria amaghị na ụọ̄ị nsogbu coronavirus nwere ike ịbịa

  • E nwere oche mmadụ anọghị n'ụlọomeiwu e kwesịrị dịka iwu si dị ekweghị ighe oghe karịa abalị iri atọ mana nsogbu coronavirus emela ka aghara inwe ohere mee ntuliaka itinye mmadụ.

Akụkọ ga-amasị gị