Onweghị mwakpo ndị ọchị ehi anyị ma mere na steeti Ebonyi - Ndị Uweojii

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola sị na ha amaghị ihe ọbụla gbasara mwakpo ndị ọchị ehi na steeti ahụ.

BBC Igbo kpọrọ Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ, o kwuru sị na ruo ugbua, na ha anabatabeghi ozi nke ha ji enweta mkpesa ọbụla gbasara mwakpo ndị ọchị ehi.

Odah kwuru na naanị ihe nkwafu ọbara merela nso nso a ha ma maka ya bụ otu nwaanyị na nwa ya ndị obodo Agịla gburu ebe ọ gara ịkọ ugbo ya dị n'okeala ebe ndị Benue steeti na Ebonyi na-azọ oke.

Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ malitere ifesa akụkọ na ndị ọchị ehi wakporo ma bibie ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti, n'elu soshal midia.

Okwu mwakpo ndị ọchị ehi a malitere inwu ọkụ dịka akụkọ pụtara na mmadụ na-eso ụgbọala bu nri na akụrụmgwa ndị ọzọ abata ọwụwa anyanwụ n'agbanyeghị na gọọmentị machiri isi steeti ga steti maka iji gbochie mbawanye coronavirus.

Ndị so agbasa akụkọ a bụ ndị otu Ipob dịka onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu na-ekwusi ike na ndị Fulani na-achị ehi na-abịa ọgụ n'ọwụwa anyanwụ.

Nchọpụta BBC bụ na ọtụtụ akụkọ mwakpo a na abụ nke metụtara ọgụ a na-anụ kemgbe dịka nke metụtara obodo Agila dị na steeti Benue na ndị Ngbo - dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu - ha na ha nwere oke ala.

Ọkwa otu ọchịchị ime obodo Ohaukwu a ka ndị mere ihe onyonyo a dị n'akụkọ a sị mwakpo ha na-egosi mere.