Igbo culture: Ụzọ ise esi amara nwada Igbo zuru ka e mee

A na-asị na nwaanyị bụ ihe maọbụrụ nke na-ewebata akụ.

Agbala nwaanyị na-aka ibe ya.

Lee ihe ise mere ndị gboo ji ekwu na nwaanyị na-aka ibe ya.

Nke bu ụzọ bụ ọlaedo ya

Nwaanyi ọbụla tozuru etozu n'ala Igbo anaghị eji ọla aka ya maọbụ ọlaedo ya egwuegwu egwu.

Ọ ga-awa emume ọha, ọ nyakọsia ya na-azọnye ije. O nwereike ire ọlaedo ahụ were ego ya goro agbaagba ihe bara nnukwu uru dịka ala, ụlọ maọbụ ụgbọala.Ite ọna

Ọ na-abụ emewe mmemme n'ala Igbo ma ite ọna apụtabeghị, ịmara na mmemme ahụ ezubeghị oke.

Ite a kacha galaa ọnụ n'ime ite niile ụmụwaanyị ji esi nri n'ala Igbo.

Agadaga nwaanyị Igbo ji eme ọnụ mewe mmemme ite ọna ya niile apụta ama iji gosi na ọ dị nkwadobe maka ya bụ emume.Efere puruiche eji eri nri

O nwere efere ga-abu ewere nye gi nri, ọ dị gị ka nri ahụ agwuchala agwụchala. Nke a bụ ụdiri nwaanyị na-eme ọfụma n'ala Igbo nwere o ji enye di ya maọbụ ndị ọbia nri.

A na-eji ọlaedo, ọla nchara maọbụ igwe nkụwa (ọkụ) eme ụfodụ efere a bụ eriwe na ya echezọ mkpa.Ubi na ọbaji na ọbaede ya

Ị chọrọ ima nwaanyi na-emesi ike n'ala Igbo mgbe gboo, jụọ ese ọbaji na ọbaede ya.

Ọ gaghị agbajo ikọ ma hazie ji na ede ndị ọ ga-ere ere na nke ya na ezinulọ ya ga-eri. Otu ụmụnwaanyị

Nwaanyị Igbo ọbụla ma uru ị nọ n'otu ụmụnwaanyị obodo ya maọbụ obodo ebe a na-alụ bara.

A na-akwanyere nwaanyị ọbụla so n'otu umụnwaanyị nnukwu ugwu. Agba na-aka ha n'okwu gbasara ndozi obodo. A na-ekwu na oke nwaanyi so n'otu ụmụnwaanyị anaghị efu efu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: