Price of fuel: 'Gọọmenti nye anyị obere oge ka anyị rechaa nke anyị nwere enwe' - IPMAN Enugwu.

- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
Na agbanyeghị iwu ọhụrụ gọọmenti etiti nyere ka e wetuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, ndị na-ere mmanụ n'Enugwu ka kwụ ebe ha kwụ.
BBC gagharịrị n'ọtụtụ ọdọ mmanụ dị n'Enugwu ụtụtụ Tọzde were hụ na ha ka na-ere mmanụ n'ọnụ ₦145.
Naanị ọdọ mmanụ NNPC Mega Station dị n'Enugwu bụ ndị na-erezị ₦125.
Ndị otu na-ere mmanụ ụgbọala n'Enugwu bụ IPMAN ayọọla gọmenti ka onyetụ ha obere oge ka ha wee rechaa mmadụ ha buteburu oge gara aga n'ihi na ha zụrụ ya oke ọnụ.
Onye isi IPMAN Enugwu bụ Mazi Chinedu Anyaso kwuru na ya bụ ntụziaka gọmenti bìara na mberede nke mere na ọtụtụ ndị ọtụ ha eruwabeghị isi na ya bụ iwu.
Anyaso kwuru na gọmenti kwesịrị inyekwu ha obere oge tupu amalite ya bụ iwetu ego n'ihi na ọtụtụ n'ime ha bụ ego ebitere ebite ka ha ji azụ ahịa mmanụ.
Akụkọ ga-amasị gị:





