New Anambra Burial Laws: Ihe 10 dara ụda n'iwu akwamozu ndị steeti a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kamgbe ụnyahụ bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Maachị ka iwu ọhụrụ nke akwamozu n'Anambra steeti ji ewu n'elu soshal midia.

Ọ bụ n'afọ 2019 ka omeiwu Charles Ezeani tụpụtara ya bụ iwu, tupu ụlọ omeiwu nke Anambra steeti suo ya kpọm na 2019 kwuru na ọ bụ iji mee ka oke ọnụ akwamozu na-ada na steeti ahụ datuo kpam kpam.

Ezeani kwuru na ọ chọpụtara na akwamozu kwesiri ịbụ oge iru uju bịakwaziri bụrụ ọnọdụ oriri na nkwarị.

O kwuru na iwu a ga-eme ka ndị mmadụ ṅụọ mmiri tọgbọ iko maka nsogbu ndị obodo na-enye ha ma ha na-akwa ozu.

Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.

Lee ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ n'ime iwu akwamozu ọhụrụ nke Anambra

  • A ga-enwe otu ga-eme ihe niile ịhụ na edebere ya bụ iwu ma na-akwụ ha ụgwọ. Ha ga-anọkwa ebe a na-akwa ozu.
  • Onye ọbụla dara iwu a ga-aga nga ọnwa isii maọbụ kwụọ ụgwọ ruru otu puku narị naira
  • Umuada agaghị ananwu nwaanyị ọbụla na-akwa nne ya karịa naira puku iri
  • Agaghị akwa ozu n'ụbọchị ndị obodo na-azụ ahịa
  • Naanị egbe a ga-agba n'akwamozu bụ 'Nkpọnana'
  • Ọ bughị iwu na ị ga-esi nri maọbụ kee mmanya ụbọchị a na-akwa onye nke gị
  • Ị gaghị ahapụ ozu ọbụla karịa ọnwa abụọ na motuary
  • Ndị nwe ozu ga-akwụ ụgwọ ha ji obodo maọbụ ụlọụka tupu eli ozu onye nke ha
  • ị gaghị eji n'ihi na ị na-akwa ozu gbachie ụzọ ebe ndị mmadụ si agafe belụsọ ị na-atara nkwado n'aka ndị isi okpuruọchịchị
  • Ị gaghị ekowe akwa na-egosi akwamozu ị na-akwado imee nanị ntuzi etu ndị mmadụ ga-esi rute ebe a na-akwa ozu

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka iwu a n'elu soshal midia.

@TauhidAfc kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị mmadụ katọọ ụfọdụ ihe megidere omenala n'ime iwu a.

Lee akwụkwọ iwu ahụ n'uju ebe a

Akụkọ ndị ga-amasị gị