Burial Ceremony: Akwamozu o kwesiri ịbụ oriri na nkwari?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Igbo na-ekwu na ozu onye mmadụ amaghị na-adị ka nkụ dị n'akụkụ ụzọ.

Akụkọ na-ekwukwa na ugwu diri onye nwụrụ anwụ bụ ka ndị nwe ya lie ya nkeọma.

Mana kedụ ihe bụ ili mmadụ nkeọma?

O nwere ndị sị na ọ bụ itinye ezigbote ego na-akwamozu onye ahụ nwụrụ anwụ site n'ime emume gbagotere.

Mana, ụfọdụ ndị dịka onye ejije Nollywood a ma ama bụ Yul Edochie sị na ọ hụghị uru dị n'imefu oge ego n'akwamozu mmadụ.

Kama na ọ ga-aka mma inye onye ahụ ego ahụ mgbe ọ ka dị ndụ karịa imegu n'ọnwụ ya.

Okwu ya dara ụfọdụ mmadụ ghaarịị na ntị, mana ọ bụghị ya bụ mbụ na-ekwu ụdịrị okwu a.

Nwaanyị Ọcha, bu onye ocha lụrụ onye Igbo, tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu mgbe o nyere ndụmọdụ ka akwa mmadụ oge ọ dị ndụ ghara imefu oge mgbe mmadụ lara mmụọ.

Kedụ ihe omenala Igbo kwadoro e ji eli mmadụ?

Otu onye ọdịnala bụ Maazị Kalu Okorie Uzu gwara BBC Igbo na oge mbụ na ndị Igbo anaghị emefu oke ego n'ili onye nwụrụ anwụ.

Ọ sị na a na-eli onye nwụrụ anwụ ọ karịa n'ime otu ụbọchị ọ nwụrụ, na ohere a bụ iji mara na ọ nwụọla n'ezie.

Maazị Kalu sị na ọ bụrụ na e me ihe ndị ahụ omenala kwadoro dịka ịzụ ọji, mmanya, ọkụkọ maọbụ ewu, nri dgz. na o zuola ili mmadụ.

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka ebelata ọtụtụ ego a na-emefu ugbua n'ihi ili onye nwụrụ anwụ.

Mana agbanyeghi nke a, ọtụtụ mmadụ na-ahụ akwammozu ka ihe oriri na nkwari.

N'iji mezuo nke a, ọtụtụ ndị na-ere akụnaụba ha nke gụnyere ala, ụgbọala, ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ.

N'obi ndị a, ha na-asị na ọ bụ ụzọ e ji akwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu ruru ya nke mere na ọ ga-ara ịkwụsịtụ ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: