Anambra state agaghị akwazi ozu karịa otu ụbọchị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

Ụlọomeiwu Anambra Steeti emeela iwu ga-amachi itufu oke ego n'akwamozu onye nwụrụ anwụ bụ nke ha kpọrọ "iwu eji ejikwa mmemme ili na akwamozu mmadụ na steeti"

Ụlọomeiwu a kwuru na ọ bụ ịda iwu ma ọ bụrụ na e mee mmemme akwamozu onye nwụrụ anwụ karịa otu ụbọchị.

Onye tụnyere atụmatụ iwu a bụ Charles Ezeani, na-anọchite anya Anaocha II n'ụlọomeiwu Anambra Steeti.

Iwu a kwukwara na agaghị e dosa ozu mmadụ n'ụlọ ozu karịa ọnwa abụọ onye ahụ nwụrụ, ebe emume akwamozu agaghị akarị otu ụbọchị.

N'ajụjụ BBC Igbo gbara Pete Ibida na-anọchite anya Njikoka 2, o kwuru na ha na-eche ka gọvanọ Willie Obiano tinye aka n'akwụkwọ ga-eme ya iwu.

Ọkaikpe agbahapụla ikpe Okorocha

Ọkaikpe Taiwo Taiwo ji ikpe Gọvanọ Rochas Okorocha na ụlọọrụ Inec akwọchapụla aka n'ikpe ahụ.

O kwuru na ikike ya erughi ichabi ikpe n'akwụkwọ Okorocha gbara ụlọọrụ Inec maka ịkpachi asambodo ya n'ihi akwụkwọ onye ji aha PDP zọọ ọkwa ahụ bụ Jones Onyereri gbara ya.

Uweojii nwụchiri ndị ntọrị abụọ

Ndị uweojii Legọs Steeti kwuru na aka ha akparala mmadụ abụọ a na-enyo so na ndị tọọrọ onyeisi ụlọọrụ ndị mgbanyụ ọkụ bụ 'Fire Service' na Legọs.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Bala Elkana kwuru na mmadụ abụọ anwụchiri n'abalị asatọ nke ọnwa Epụrelu afọ 2019 na-enyere ha aka ịchọpụta ndị otu ha.

N'ofesi

Na mba Taiwan, onye dọkịnta fopụtara aṅụ dị ndụ anọ febara ma biri n'ime anya otu nwaanyị a kpọrọ He, oge ọ nọ na-abọcha ahịhịa dị n'akụkụ ili.

N'egwuregwu

Ugo ga-ebere na mgbagbu n'abalịa dịka Manchester United ga-anabata Barcelona n'asọmpi Uefa Champịọns Lig.

Ebe Ajax Amsterdam ga-elekwa Juventus ọbịa.

Nkeji

Ntuliaka Izrel dịka ọ na-agba nhatanha

Ntuliaka iji họpụta aka ga-achị mba Izrel kpụ ezigbote ọkụ n'ọnụ ugbua dịka amaghị onye ga-atụ ugo n'etiti pati Likud nke Benjamin Netanyahu nakwa pati "Blue and White" chọrọ ichutu ha n'ọkwa.

Patị abụọ a na-ele anya ịnwete ọkwa iri atọ n'ise n'ụlo ọmeiwu nke Izrel.

O nwekwara ndị Igbo sonyere binye aka na Izrel:

Nke pụtara na-amabeghị pati ga-akpọkọ pati ndị ga-abụ na-ahazi gọọmentị.

Buhari alọtala

Onyeisiala Muhammadu Buhari atuola ụkwụ na Naịjirịa site na njem omere gaa mba United Arab Emirates.

Ọkọtọ na-eche ya metụtara oke mwakpo na-eme mpaghara dị iche iche na Naịjirịa, okachị nke metụtara ogbugbu mmadụ, ntọrị mmadụ na mwakpo Boko Haram.

Ndị agha Naịjirịa egbuola nd Boko Haram

Ndị agha Naịjirịa na-akọwa na ha meminariri ndị omekome Boko Haram chọro ịwakpọ isi obodo Yobe steeti bụ Damaturu.

Ndị agha sị na ha gburu ọtụtụ ndị agha Boko Haram ma nye ha ọzọ ka ha tinyere isi ịba obodo ahụ.

N'egwuregwu

Asọmpị Champions league nwurulu ọkụ ụnyaahụ ka Tottengham bụ agada gbachiri ụzọ Man City ka ha ji ọkpụ goolu asataghị sị ha "chere, anyị na-abịa" .

Ọnụ otu egwuregwu Liverpool bụ sọ ọchị n'Anfield ebe ha ji goolu abụọ enweghị asisa mechie Porto ọnụ.

Gee nkeji a ebe a:

Ihe nkiri nke taa: