Ash Wednesday: Lee ka ụkantụ si aga

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụkantụ n'Adamawa

Taa bụ ụkantụ ndị ụka Kraịst n'ụwa niile.

Ndị otu Kraịst na-egbu ntụ n'ihe iji chetere onwe ha na mmadụ bụ aja, mmadụ ga-alọhachị n'aja.

Ndị ụka katọlik na Naịjirịa jikwa ohere a egosi iwe ha maka oke ogbugbu ndị mmadụ nakwa enweghị ezi nchekwa na Naịjirịa.

N'Adamawa, ndị ụka zakwara aha ha gosị na ha so n'ihe a na-eme.

Na Legọsi, ndị ụka gosiri onwe ha tupu ha agawa ụlọọrụ.

N'Enugwu, ndị ụka Katọlik mere ngagharị ekpere ka a kachara ụka ntụ.

Ndi ụka katọlịk nyekwara ntuzịaka ka onye ọbụla yiri ụweojii maọbụ kere akwa ojiri n'aka.

Mana na ụka ha dị na Falomo, Legọs, ọ bụghị mmadụ niile yi ya bụ akwa ojii dịka ụka siri kwuo.

Ọtụtụ ndị eyighị ya bụ akwa ojii sị na ha kwadoro maka ị ga ọrụ.

Agbanyeghị, ọtụtụ yikwa akwa ojii.

Ọtụtụ mmadụ juputara n'ụka Church of Assumption dị na Falomo, Legọs.

Akụkọ ga-amasị gị