You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Herders/Farmers Clashes: Gịnị ka e mere ugboro atọ ndị omekome gburu ọtụtụ mmadụ nso nso a?
Ogbugbu a na-atụgara ndị ọchị ehi "Fulani" na Naịjirịa ebidoghị taa.
Mana akụkọ anyị ga-agbado ụkwụ na ugboro ole enwerela oke ogbugbu n'otu izuụka nso nso a.
Nke ka mere ọhụrụ a bụ na Katsina ebe ndị a na-eche bụ ndị omekome wakporo ma gbuo mmadụ ruru iri atọ.
Mana gọọmenti etiti katọrọ ma kwuo ka ndị mmadụ ghara ịbọgwara ndị omekome. Nke a mere ka ụmụ Naịjirịa gbakaa n'elu soshal midia.
Ihe ọnu na-ekwuru onyeisiala zara.
@Suleima41681020 na-ajụ kedụ ihe ndị mmadụ kwesiri ime ebe ọ bụ na-achọghị ka ha bọgwara.
Na Delta steeti,
Akụkọ pụtara na Delta steeti na ndị a na-eche na ha bụ ọchị ehị wakporo obodo UWHERU dị n'okpuru ọchịchị Ughelli ma gbuo mmadụ iri na anọ.
Mana ndị agha na ndị uweojii gara ebe ihe a mere kwuru na ha ahụbeghị ozu ndị e kwuru na ndị ọchị ehi ahụ gburu.
Lekwa ihe gọọmenti Delta kwuru:
Ụwa ka na-ele anya ka ha hụ isi ogbugbu a merenu.
Maiduguri
N'izu ụka gara aga ka ndị a na-eche bụ ndị otu Islamic State in the West Africa Province (ISWAP) gburu ma gbaa ndị njem ruru iri atọ ọkụ n'obodo dị na Maiduguri.
Ndị omekome ahụ tọrọkwara ụmụnwaanyị na ụmụaka ha hụrụ n'obodo ahụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari gara tie ndị Maiduguri aka n'obi mana ka chi na-efoputa ụbọchị ọ latara njem ahụ, mwakpo ọzọ mekwara n'akụkụ ahụ.
Ruo ugbua ụmụ Naịjirịa ka na-agbagha ihe gbasara oke ogbugbu a, ebe ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na gọọmenti anaghị eme ihe gosiri na mkpa mkpa ga-akwụsị oge dị nso.