You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Valentine's Day Meaning: Ihe mere ụfọdụ anaghị eji Valentine's Day kpọrọ ihe
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụbọchị Valentine (Febrụwarị 14) nwere ndị ọ na-eme obi aṅụrị, mana ọ bụghị onye niile ka ọ na-amasị.
Ebe ndị ọzọ na-enye onyinye gụnyere ego, ihe nracha chọkọleti, flawa, ịkpọ ndị ọ dị ha n'obi apụ nlegharị anya na ihe ndị ọzọ, ndị nke a anaghị achọ iji ntị anụ maka 'Valentine' cha cha.
Nye ndị ahụ, ịhụ ebe ndị mmadụ na-enye onwe ha onyinye etu a nakwa ịhụ ebe ndị mmadụ na-eyikarị uwe na-acha ọbara ọbara nakwa/maọbụ nke ọcha agagharị (Kedụ onye kwudiri na ọ bụ agwa a ka ndị mmadụ ga na-eyi ụbọchị ahụ?) agbasaghị ha.
Mana gịnị mere e ji nwee ụfọdụ ndị ọ naghị amasị isonye n'emume a?
1) N'ihi ụdịrị ụka ha na-aga:
Maka nkwenye na mkpebi ụfọdụ ndị na-aga ụka, ha anaghị ekwe enwe aṅụrị emume ụbọchị Valentine.
N'ụka ndị ahụ, ha na-ahụta ya dịka ụbọchị 'akwamiko'; nke ha na-akọwa na akwụkwọ nsọ na-ekwu sị gbanarị.
Ha na-ahụta ya na ndị mmadụ (ọkachasị ndị agbabeghi akwụkwọ) na-eji n'ihi onyinye ha nyere ibe ha emetọsị onwe ha.
Ọmụmaatụ ụdịrị ụka a bụ ndị Ama Jehovah, bụ ndị na-ekwu na emume ndị a gụnyere ma ụbọchị ncheta ọmụmụ Kraịst bụ emume ndị ọgọmmụọ.
2) N'ihi enweghi 'ọdị gị n'obi':
Ụfọdụ ndị achọghị ịma na e nwere ihe dị ka ụbọchị Valentine n'ihi na ha na-eche na ha enweghi onye ha ga-egosi ịhụnanya.
Ha dị ihe Bekee na-akpọ 'single' ụfọdụ dịkwa 'single and searching', mana ha amaghị na ị nwekwara ike igosi ma nne na nna gị na ndị ọzọ ị hụrụ n'anya ịhụnanya, na ọ bụghị naanị ọdị gị n'obi.
Ndị ahụ na-ahụta ụbọchị Valentine dịka ụbọchị nkịtị chi fotere ka ụbọchị ndị ọzọ; ha achọghị ịma ihe mere a ga-eji kewapụta otu ụbọchị maka ngosi ịhụnanya.
Ụfọdụ bụkwa ndi enwebeghi onye gositụrụla ha ịhụnanya n'ụbọchị Valentine ọbụla.
3) N'ihi ọzụzụ ha:
N'ihi etu e si zụlite ụfọdụ ndị, emume dị ka nke a e ji egosi ịhụnanya anaghị amasị ha.
Ụfọdụ bụ ndị a dọrọ aka na ntị oge ha na-etolite ịsị ha na 'mmekọrịta na nnọkọrịta nwoke na nwaanyị adịghị mma'.
Ụfọdụ bụ ndị a gwara na nwoke na nwaanyị anaghị abụ enyi.
Ụdịrị ndị dị etu a anaghị eji ụbọchị dị etu a kpọrọ ihe n'ihi na a zụnyeghị ha ụdịrị omume ahụ n'ahụ.
4) N'ihi na ịhụnanya agwọọla ha ara:
Ụfọdụ ndị 'adapụla n'okwukwe' emume ụbọchị Valentine n'ihi etu ha si hushie anya n'ihe gbasara ịhụnanya.
Ndị a bụ ndị ọ na-amasịbu, mana n'ihi otu ihe maọbụ abụọ tara akpụ ha hụrụ n'aka ndị bụbụ ọdị n'obi ha, okwu gbasara ịhụnanya maọbụ ụbọchị ngosi ịhụnanya abụghị ha ka ị na-akọrọ.
Ha achọghị ịma ma Valentine na onwe ya osi n'ọnwụ kulie ụbọchị ahụ, n'ihi na ha achọghịkwa ịnwa aka ha n'ịhụnanya.
Akụkọ ndị a ga-amasị gị:
Ihe nkiri a maka mba ndị anaghị eme emume Valentine ga-amasị gị: