Deezell na Maryam Booth: Onye nwe ihe nkiri mgbariọtọ ha na-agbagha?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Maryam Booth bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa ama ama ekwuola ihe ọ ma maka ihe nkiri mgbarịọtọ a na-eche na ọ bụ ya na-efegharị n'elu soshal midia.

O depụtara n'akara Instagram ya na ọ bụ onye bụbu ọyị ya nwoke akpọrọ Ibrahim Ahmad Rufai sere ya foto mgbarịọtọ ahụ mgbe ha na-eme enyi n'afọ atọ gara aga.

Ọ kwuru na Rufai na-ana ya ego ka ọ ghara iwepụta ya bụ foto mana ọ gbagwojuru ya anya ka ya bụ foto si pụtakwazịa n'elu soshal midia.

Ọsịsa ya na-abịa ka Rufai onye eji Deezell wee mara gọnahụrụ ya bụ okwu site n'idepụta ogologo okwu n'akara twitter ya.

Kamgbe ahụ ndị mmadụ amanyela ọnụ n'elu soshal midia.

@fag_glamour si na ihe nke a gbagojuru ya anya.

@ArewaWoman kwuru na ọ bụ ọyị rara Maryam Booth nye

@EagleAdekoya kwuru na onye ọbụla na-eme ọfụma ga-enweriri nkatọ.

Ụmụ ụwa ka na-eche ka ha hụ ihe ọzọ ga-esi na ya bụ okwu pụta.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: