You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Arthur Agwuncha Nwankwo: Onye bụ odeakwụkwọ a?
Onye odeakwụkwọ a ma ama bụ Arthur Agwuncha Nwankwo anwụọla.
Ọ nwụrụ n'ụbọchị satọde, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Febrụwarị 2020, n'ụlọọgwụ University of Nigeria Teaching Hospital (UNTH) nke dị n'Enugwu steeti dịka ọ gbara afọ 77.
Tupu ọ nwụọ, ọ rụrụ ọrụ na National Democratic Coalition (NADECO) dịka onyeisioche ha.
Nke a mere ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwanyere ya ugwu ikpeazụ ma zigara ezinaụlọ ya ozi itiakanobi site n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina.
Gọọmentị Anambra steeti kwanyekwara ya ugwu ikpeazụ.
E ji ụfọdụ akwụkwọ dịka "Danda" nakwa "Tales out of School" were mara ya.
Ihe ndị ị maghị maka Arthur Agwuncha Nwankwo
- Maazi Nwankwo bụ onye Ajali dị n'okpuruọchịchị Orumba North n'Anambra steeti.
- Ọ gbapere ụlọọrụ "Fourth Dimension" na-ebipụta ọtụtụ akwụkwọ.
- A tụrụ ya nga otu afọ n'afọ 1982, n'ihi akwụkwọ o dere a kpọrọ "How Jim Nwobodo Rules Anambra State".
- A nwụchiri ya ọzọ n'ọnwa Juun afọ 1998 maka ịkpọ oku ka mba Amerịka lebanye anya n'ọchịchị nchịgbu na Naịjirịa.
- Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti n'afọ 1983 n'okpuru People's Redemption Party (PRP).
- Ọ chọpụtara otu a kpọrọ Eastern Mandate Union nke e hibere maka nchịkọta oke ndị Igbo na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Otu ndị ọzọ o so na ya gụnyere PMP, People Progressive Party (PPP) nakwa ụlọ mbipụta ọzọ o hibere bụ Nwamife Publishers dị n'Enugwu.
Ihe nkiri a ga-amasị gị: