You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bottled Leopard: Chukwuemeka Ike, onye na-ede akwụkwọ a ma ama, anwụọla
Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Chukwuemeka Ike anwụọla.
Ọ nwụrụ dịka ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ n'ụlọọgwụ Nnamdi Azikiwe nke dị na Nnewi.
Otu onye ma maka ọnwụ Igwe Ike sị na "ọ nwụrụ n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị dịka ọ rịara ọrịa obele oge."
Ọ sị na dịka ọ bụ Eze, akpọbeghị okwu ọnwụ ya aha kpọm kwem.
Chukwuemeka Ike bụ Igwe na-achị Ndikelionwu dị n'okpuruọchịchị Orumba North n'Anambara steeti.
Akwụkwọ e ji mara ya bụ Bottled Leopard nakwa ndị ọzọ.
Ihe ise ị maghị maka Chukwuemeka Ike
- Ọ mụtara nanị otu nwa aha ya bụ Osita Ike mana ọ nwụọla.
- Ọ lụrụ onye Yoruba bụ Ọkammụta Adebimpe Ike.
- Ọ bụ Eze Ndikelionwu dị n'Anambra steeti dịka nna mụrụ ya siri bụ
- Ọ bụ ya mere ka a na-akpọ ị ghọ aghụghgọ n'ule "Expo" site n'akwụkwọ o dere maka ya a kpọrọ "Expo 77"
Ndị mmadụ na-akwanyere ya ugwu ikpeazụ
Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru PDP bụ Atiku Abubakar si ka mkpụrụ obi ya laa na ndokwa
Uzochukwu Nkamuke kwuru etu na ọnwụ Igwe Ike wutere ya
Michael Chiedoziem kwuru na ọ bụ odogwu n'odeeakwụkwọ
Chioma kwuru na akwụkwọ ya Bottled Leopard bụ akwụkwọ kachasị masị ya
Akụkọ ga-amasị gị