You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Benjamin Uwajumogu alaala mmụọ
All Progressive Congress akwala arịrị maka ọnwụ Sịnetọ Benjamin Uwajimogu bụ onye otu ha na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu.
N'ozi ha depụtara n'akara twitter kwuru na Uwajumogu bụ onye umeala maara nke ekwe na-akụ na ndọrọdọrọ ọchịchị.
Sịnetọ Benjamin Uwajumogu anwụrụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Wednezde 18 Disemba, afọ 2019.
Onye bụbụ Kaụnselọ na-anọchiteanya Ideato North bụ George Ukeh gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu.
Ukeh sị na o nwetere akụkọ ọnwụ ya n'ọgbakọ 'Whatsapp' nke ndị pati APC Imo steeti n'ụtụtụ taa.
Onyeisioche pati APC n'Imo Steeti bụ Dan Nwafor sị na ọnwụ ya bụ ihe ijuanya nakwa oke ụsụ nye APC, Imo steeti nakwa Naịjirịa.
Ruo oge ọnwụ ya, Uwajumogu bụ onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ndị ọrụ bekee, iwe ndị mmadụ n'ọrụ nakwa ịrụpụta ihe.
Ihe e ji echeta ya bụ na ọ chepụtara iwu ga-ekpuchi ndị na-agba mpụ na nrụrụaka n'anwụ a kpọrọ 'Whistleblower and Witness Protection Bill'.
Anyị ka na-agba mbọ ichọpụta ihe gburu ya bụ nke anyị ga-ewete n'uju.
Ihe i kwesịrị ịma maka Benjamin Uwajumogu
- A mụrụ ya n'obodo Umuihi dị n'okpuruọchịchị Ihitte/Uboma nke mpaghara Okigwe, Imo Steeti.
- Ọ gụrụ akwụkwọ n'Uboma Sekọndịrị dị n'Ikperejere Etiti, gụọkwa na Mahadum New Jersey dị n'Amerịka, Madadum De Sorbonne nakwa Mahadum Schiller dị na Paris, Fransị.
- Ọ lụrụ nwaada Elleen Uwajumogu, ha mụrụ ụmụ atọ
- Ọ bụ onyeisioche mbụ ndị 'Social Democratic Party' n'Ihitte/Uboma n'afọ 1990, mgbe ọ dị naanị afọ 25.
- Ọ bụbụ onyeisioche ụlọomeiwu Imo Steeti n'afọ 2011 ruo afọ 2015.
- Ọ bụ Sịnetọ na-anọchiteanya Imo North n'ụlọomeiwu ukwu n'aha pati All Progressive Congress (APC).
- O nwetere ụfọdụ nturuugo site n'aka 'Chamber of Commerce' Abia Steeti, 'Rotary Club' nke Enugwu na ndị ọzọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: