DJ Arafat dead: Ndị otiegwu akwaala arịrị n'ihi ọnwụ ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị otiegwu dị icheiche na Naịjirịa nakwa mba Afrịka ndị ọzọ ebeela akwa arịrị n'ihi ọnwụ onye otu ha a ma dịka DJ Arafat.

DJ Arafat ndị Naịjirịa ga-echeta n'ihi egwu ya na J.Martins kụrụ nke a kpọrọ "Touching Body", nwụrụ n'ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst, 2019 na mmerụ ahụ o nwere n'ihe mbere okporoụzọ.

Akụkọ kwuru na ọ na-agba ọgbatumtum ya mgbe ya na ụgbọala sukọtara isi.

Ọnwụ nwaamadị a wutere ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị otiegwu ibe ya n'Afrịka gụnyere Davido na ndị ọzọ.

J.Martins bụ onye ya na ya kụkọrọ egwu, tinyere okwu nke ya

Onye bụ DJ Arafat?

  • Ezigbo aha DJ Arafat bụ Angie Didier Huon, a mụrụ ya n'ụbọchị 26 Jenụwari, afọ 1986.
  • A mụrụ ya n'obodo Yopougon dị n'Abidjan nke Ivory Coast.
  • Aha nne ya bụ Tina Glamour bụkwa onye ama ama n'iti egwu.
  • DJ Arafat so na ndị kachasị eti egwu na mba ndị na-asụ asụsụ Fransị n'Afrịka.
  • O ritere nturuugo dị iche iche nke gụnyere 'Best Francophone Award at the 2015 MAMAs'
  • DJ Arafat na ụmụ Naịjirịa ndị dịka J. Martins, Davido na Iyanya gụkọrọ egwu.

Akụkọ ga-amasị gị: