Buhari Resign: 'Anyị agaghị asa Garba Shehu, okwu a karịrị ya' - Ọnụ na-ekwuru Abaribe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ na-ekwuchitere Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom azaghachila okwu Garba Shehu kwuru maka ọkwa Abaribe mara ka Onyeisiala gbaa arụkwaghịm.

Maazị Abaribe sị na ihe butere ya bụ ọkwa bụ maka etu nchekwa obodo Naijirịa siri kụọ afọ n'ala.

Kama, onyeisiala Buhari sitere n'ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Shehu zahachi ya, were sị - na ụfodụ ndị na-ekwu ka Buhari pụọ n'ọchịchị abụghị na ọ bụ uche ndị Naijirịa niile.

Gụọ ihe o kwuru n'ụjụ ebe a.

N'ịza ihe o kwuru, Awom sị "agaghị ewetu okwu a ala maka na o rughi Garba Shehu ọnụ".

Ọ kọwakwara na ọ bụ ihe Sinetọ Abaribe kwesịrị ime ka o mere dịka onyeisi ndị omeiwu na-anọghị n'ọchịchị.

Ọ sị "ọrụ ya dịka onyeisi ndị anọghị n'ọchịchị bụ igosi gọọmenti ebe ha riri mperi."

O kwuru na ihe kacha dị Abaribe mkpa bụ nchekwa ndụ na akụnaụba ndị Naijirịa niile.

Ihe o kwuru dịka Shehu rụtụrụ okwu Nnamdị Kanu aka

Awom sị na okwu Nnamdi Kanu bụ ihe dị n'ụlọikpe, "Shehu ekwesịghị itinye ọnụ n'okwu dị n'ụlọikpe".

Dịka ụlọikpe kwuputara atụmatụ maka ụgwọ mgbapụta Kanu, Awom kwuru na Abaribe mere ihe o kwesiri ime dịka onye Igbo.

O kwukwara sị na ha agaghị ekwu maka okwu Kanu n'ihu Shehu maka na Shehu abụghị ụlọikpe.

Ọ bụghị taa ka Abaribe bidoro ikwu maka ihe ndị Naịjirịa na-agabiga, ọkachasị ebe o metụtara nchekwa, dịka na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe a:

Ọtụtụ ndị mmadụ kwuputara obi ha maka ọkwa a mara ka onyeisiala gbaa arụkwaghịm, lee uche ha:

Tosin Olugbenga chetara ihe gọọmentị Buhari kwuru mgbe ha banyere n'ọchịchị.

Leesi Barivole sị "Dịka anyị kwadoro #justiceForChima, ka anyị kwadokwa #BuhariResign".

Adeparusi Adebayo sị "ọzọ e bo Abaribe ebubo nrụrụaka".

Baba Alhaji sị na Abaribe kwesịrị ịnọ na nga.

Akụkọ ga-amasị gị