Abaribe kwesịrị ịnọ nga maka Nnamdi Kanu - Garba Shehu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Garba Shehu bụ ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola sị na Enyinnaya Abaribe bụ omeiwu na-anọchite anya Abịa Saụt n'Ụlọomeiwu Ukwu kwesịrị ịnọ na nga.

Ka Ụlọomeiwu na-eme ọgbakọ ha nke Wenezde bụ ụbọchị nke 29 nke ọnwa Janụwarị, Abaribe sị na ọ bụrụ na Onyeisiala Buhari agaghị echekwanwu Naịjirịa, ya buru akpa ya laa.

Abaribe sị na o kwuru nke a makana o gosiri na Buhari agaghị achịtanwu Naịjirịa.

Ọ sị na ihe tụrụ ya n'anya bụ na onyeisiala sị na oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa na-atụ ya n'anya.

Okwu ya abụghị ihe a nabatara nke ọma n'ogige gọọmentị.

Shehu na onwe ya gbarụrụ ihu maka okwu Abaribe.

O kwuru uche ya na Twitter sị na Abaribe enweghị ikike ikwu ụdịrị okwu a o kwuru, makana o so na pati ọ sị tinyere Naịjirịa n'ọnọdụ ọ nọ ugbua.

Ọ gakwara n'ihu sị na Abaribe, dịka onye gbaara Nnamdi Kanu akaebe, nyere ya ohere iji gbanarị ikpe gọọmentị na-ekpe ya, kwesịrị ịnọ na mkpọrọ.

Ọ sị na ọ bụrụ na Buhari ga-aritu n'ọkwa, ọtụtụ mmadụ gunyere Abaribe kwesikwuru iritu.