You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enyinnaya Abaribe: Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe
Ikike onyekwuouche ya na-akawanye njọ ugbua - Abaribe
Senetọ Enyinna ya Abaribe etiela mkpu maka ihe ọ kpọrọ "kpachi ndị mmadụ ikwu uche ha na Naijiria."
Abaribe, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde n'ihe gbasara iwu 'social media' na iwu 'Hate Speech', gbadoro ụkwụ na nwụchi a nwụchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ, na ndị kwuru uche ha maka ihe na-aga n'obodo.
Dịka Abaribe kwuru na ya maghị n'uju ihe dị n'iwu 'Social media' na iwu 'Hate speech' n'uju, gara n'ihu gwaa ndị na-akpa nkata ime iwu a ka ha saa anya mmiri.
Abaribe onye gụpụtara ọtụtụ okwu Lai Mohammed kwuru n'oge ọchịchị Jonathan sịrị na : "Ọ bụrụ na iwu 'hate speech kwuru ka akwụgbuo onye dara ya di ire n'afọ 2012 rue 2015 oge Lai Mohammed na-ekwu ụdị okwu ọjọọ ndịa maka Jonathan, Lai Mohammed ọ kara adị ndụ ugbua?"
Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
- Ọ bụ anabataghị echiche ndị ọzọ mere ka ụfọdụ na-achọ ịkwado iwu 'hate speech'
- Ihe na-eme, ihe na-atụ ndị mmadụ egwu bụ na iwu a nwere ndị e bu n'obi achọ iwepụta ya
- Ihe ga-enyere anyị aka weta ịdịnotu bụ: Onye ọ sọrọ ya bụrụ onyeisiala, onye omeiwu, gọvanọ, ọkaikpe bụ ikpemkwụmọtọ, mee onye ọbụla ka i mere ibe ya
- Anyị nwere iwu gbasara mmadụ ikwu okwu asị megide agbụrụ ndị ọzọ mana nsogbu bụ itinye ha n'ọrụ
- Mgbe ụfọdụ sọchal midia na-eweta mgbakasị ahụ mana ị ga-eji maka nke a sị ka a kwugbuo ha?
- Anyị anaghị ahụ site n'aka gọọmenti na ndị chọrọ ime iwu, obiọcha ime onye ọbụla dara iwu ka e mere ibe ya dịka Iwu Naijiria si kwuo.
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọsịsa Lai Mohammed nye okwu a Abaribe kwuru, mana ọ zaghị ekwentị ya.
Kogi state: Ụlọomeiwu ukwu ekwela ka e binye Kogi steeti nde iri
Dịka Kogi steeti na-akwado maka ntuliaka gọvanọ n'oge na-adịghị anya, ụlọomeiwu ukwu ekwenyela ka e binye ha ego..
Ụlọomeiwu ukwu akwadola arịrịọ onyeisiala Muhammadu Buharị rịọrọ ka e binye Kogi State ijeri naịra iri ka ha were kwụọ ụgwọ ha jigasị.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-atamu na ego ahụ nwere ike ịghọ ihe ndị APC ga-eji zụọ vootu na steeti ahụ na ntuliaka a ga-eme n'oge na-adịghị anya.
Ọnwụ ezutela ndị uweojii
Ndị omekome agbagbuola ndị uweojii abụọ na Kaduna steeti dịka Ali Ali Janga bụ kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ si kwuo.
Cheta na akụkọ kwuru na a gbagburu ndị uweojii abụọ na Bayelsa ụbọchị Tuuzde.
David Villa achịliela akpụkpọụkwụ ya
Nwaokorọbịa gbabuuru otu Barcelona nakwa mba Spen bọọlụ aha ya bụ David Villa alaala ezumike nka.
Villa, onye nọ Japan agba bọọlụ ugbua, kwuru na ya ga-awụsa ọwa n'ọnwa Disemba mgbe afọ bọọlụ nke mba Japan ga-abịa n'isi njedebe.
Gịnị na-esere Obaseki na Oshiomhole?
Esemokwu dị n'etiti gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki na nna ya ukwu bụ Adams Oshiomhole agafewela ọgụ nne na-agbara nwa ya.
Otu jikọrọ ndị gọvanọ APC akwanyela Oshiomhole ọkụ n'ike ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu maọbụ kwara ngwongwo ya rituo.
Dịka ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na-erute nso na Edo State, esemokwu dị n'etiti gọvanọ Obaseki na Oshiomhole na-akawanye njọ.
Esomokwu a etisaala pati APC ụzọ abụọ, otu ụzọ na-ekwu na ha achụpụla Oshiomhole na pati ha.
Mana otu ndị nke ọzọ kwuru na ọbụ Obaseki ka ha chọrọ ka o si na APC pụọrọ ha.
O nwebeghị onye ma nke bụ nke.
Esemokwu Oshiomhole na Obaseki pụtara ihe n'ọnwa Juun.
N'oge ahụ ka onyeisi ọkaikpe nke Edo Steeti ji abalị wee duo ndị omeiwu steeti ahụ n'iyi ọrụ.
N'ime mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ, naanị mmadụ itoolu ka e duru n'iyi ọrụ n'oge ahụ.
Akụkọ kọrọ na ndị ahụ e duru n'iyi ọrụ bụ ndị na-akwado Obaseki ebe ndị ọzọ bụ ndị otu Oshiomhole.
Ikpe ọnwụ ọ na-eche onye kwuru okwu asị?
Akụkọ gbasara iwu ọhụrụ ndị ụlọomeiwu ukwu na-atule iji gbochie okwu asị ka na-akpọtụ n'elu n'ala Naịjirịa.
Onye wepụtara iwu a bụ Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye ji ọkwa Chief Whip.
Ihe kpatara iwu ọhụrụ ji ewu ewu bụ na ndị mmadụ kwuru na e nwere ike iji ụdọ kwụgbuo onye a mara ikpe maka ikwu okwu asị.
Ntaramahụhụ ndị ọzọ gunyere ịtụ onye dị otu ahụ mkpọrọ ndụ ha niile maọbụ ogologo afọ.
Iwu ahụ kwukwara ka e kewapụta ngalaba ga na-ahụ maka mgbochi ikwu okwu asị.
Cheta na Aliyu Sabi wepụtaburu iwu a n'afọ 2018 mana ọ gafeghị.
Nke a mere ka o wepụtakwa ya ọzọ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tuzde.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu.
Moghalu Kingsley kwuru na iwu ahụ kwesịrị ka a kwụgbuo ya.
Shehu Sanị kwuru na iwu ahụ gosiri aka ike ndị nọ n'ọchịchị.
Onye ọzọ kwuru na iwu ahụ n'onwe ya bụ okwu asị.
Ihe Atiku kwuru
Onye bụbu osote onyeisiala Naịjịrịa bụ Atiku Abubakar gwara ndị ụlọomeiwu Senate ka ha gbara ọgwụ ha ṅụọ gbasara iwu ọhụrụ a.
Atiku kwuru na iwu ahụ ga-emegide ikike nkwuwa okwu bụ nke Bekee pkọrọ 'Freedom of speech'.
O kwukwara na ọ dị ọtụtụ ihe na-emebi emebi na Naịjirịa bụ nke ndị omeiwu kwesịrị ileba anya.
A ga-amachi ịrịọ arịrịọ na Borno
Ekeresimesi bidoro nnọọ n'oge maka ndị arịrịọ bị na Borno State.
Gọvanọ ha bụ Babagana Umara ji puku naịra iri atọ gbachaa ha niile ahụ n'otu n'otu.
Ihe ruru mmadụ puku asaa ketara ego a.
Mana gọọmentị kwuru na onyinye ahụ bụ iji kwadoo ha maka mmachi ịrịọ arịrịọ bụ nke a ga amalite n'oge na-adịghị anya.
Na Bolivia
Nwanyị onye omeiwu na mba Bolivia aha ya bụ Jeanine Anez ejirila aka ya mee onwe ya onyeisiala dịka onyeisiala Evo Morales gbachara arụkwaghị m.
Anez kwuru na dịka iwu obodo sị dị, ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ka o ruru n'aka irigoro n'okwa onyeisiala.
Ụlọomeiwu kachasị na mba Bolivia kwadoro Anez maka ihe o mere.
Ngagharịiwe na-aga n'ihu na Bolivia maka ọchịchị ọjọọ.
Mmiri ejula elu na ala na Venice
Mmiri etojuola elu na ala n'obodo Venice dị na mba Ịtali.
Nke a mere ka ụlọ obibi nakwa ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ụlọụka dị icheiche jupụta na mmiri.
Ụdị ihe dị etua emebeghị n'obodo ahụ kamgbe afọ iri ise gara aga.
Mgbe ikpeazụ ihe dị otu a mere bụ n'afọ 1923.
Naịjịrịa na Bene Repọblik
Ụlọ ejula ugbua n'ogige ndị Super Eagles dịka ha na-akwado izute mba Benin Republic na mgbede Wenezdee.
Asọmpi a bụ iji tozuo maka iko mba Afrịka nke afọ 2021.
Ọ ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede taa n'ama egwuregwu nke dị na Uyo, Akwa Ibom Steeti.
Ka ọ dị ugbua, ndị otu 'Super Eagles' niile zuru ezu n'Uyo na-eche ka oge ekeremgba ruo.
Ụmụ Naijirịa ewepụla onwe ha ihere
Otu egwu bọọlụ Dream Team nke Naịjirịa emechapụla onwe ha ihere mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Zambia n'asọmpi iko mba afrịka maka ndị akarịghị afọ iri abụọ na atọ.
Otu atọ kacha mee ọfụma n'asọmpi a ga-etozu ịnọchite anya Afrịka n'asọmpi Olympics nke 2020.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: