You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nasir el-Rufai: Onye ka a ga-eji akpa ozu buru?
Onye ndọrọndọrọ ọchịchi ụmụ Naịjirịa kpụ n'ọnu ugbua bu aka na-achi Kaduna state bụ Nasir el-Rufai.
Okwu banyere el-Rufai metụtara ihe o kwuru na mkparịtaụka ya ndị ndị ọzọ mere n'ụlọ ntaakụkọ gọọmentị bụ NTA ụbọchị Tuuzde.
Na mkparịtaụka ahụ bụ ohere el-Rufai na ndị ọzọ n'ihe banyere mwepụ ewepụrụ Ọkaịkpe Walter Onnoghen na itinye ọnụ ndị mba ofesi tinyere na ya bụ okwu, el-Rufai kọwara nghọta ya n'ihe banyere mba ọzọ itinye aka na ntuliaka Naịjirịa.
Ọ sị: "arịrịọ m bụ "Intervention" bụ ọkachasị na ụdị "interference," bụ ebe mba gasị na iji ndị agha abanye obodo.
"Anyi mere ya na Sierra Leone na Liberia, bụ ihe mba ndi ọzọ rịọrọ Naịjirịa mee ma hụ na etinyere udo a obodo ahụ. Anyi mefuru ego na njem ahu, mana onweghi ihe anyị nwetere na ya. Anyi mere ya maka ọdịnama agbatobi."
Mana ebe sere okwu n'okwu ya bụ nke a:
"Ndị na-akpọ mmadụ ka ha bịa manye aka na Naịjirịa, anyi na-eche ndị ahu ka ha bịa manye aka. Ha ga-eji akpa ozu laghachi be ha makana onweghi onye nwereike ịbịa Naịjirịa gwa anyị etu anyi ga-esi chịa obodo anyị. Anyi nozi onwe anyị. Anyị chọrọ ịchị obodo anyi etu okwesiri ọfụma."
Okwu nwuru ọkụ, nke mere ndị otu pati na-anoghị n'ọchịchị bụ PDP tinye ọnu na sị na onwereike mee ka ha pụọ na nkwekọrịta enwere maka ịhu na-emere ntuliaka 2019 n'udo.
Ndị mba ofesi akpọrọ aha, ọkachasị nzukọ mba Yurope bụ "European Union" sara okwu a si na ha adịghị aba mba ọbụla ịga leta etu ha si eme ntuliaka ma ya bụrụ akpọghị ha.
El-Rufai agọla aka n'ụkwụ na-ọbụghị igbu mmadụ ka ọ na-ekwu, mana Cynthia Mbamalu bụ onye nhazi emume na YIAGA Africa bụ otu na-abụghi nke gọọmentị gwara BBC na okwu el-rufai kọrọ ọkọ na ntị makana ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị isi ya gbagotere ekwesighi ikwu okwu etu ọbụla ọchọrọ.
"Ikwu o ihe, ndị ga-anọ ya na mbụ nwereike ha agaghị anụ ya ma ekwuzie ya, ya bụ na onye nọ n'ọchịchị na-ekwu okwu, ọ ga-ewere nwanyọ kwuo ya etu onye ọbụla ga-aghọta ya. Y abụrụ na TV maọbụ redio, ya na-ekwu okwu etu ndi mmadụ ga-eji ghọta ya."
Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Abubakar Mohammed tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.
Ọ sị na onweghi ihe dị iche na-etu ha ji ahụ ajọ okwu Bekee kpọrọ "Hate Speech". Ọ bụ ka ya na ndi ntaakụkọ na-eme mkparịtaụka n'ogige ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na-eme nzuko akpọro "Stakeholders Forum" ka okwuru nke a.
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ