You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Christmas Day: Obodo bụ igwe abụghị na a gaghị agba Ekeresimesi - Bishop Onaga
Bishọp ụka katọliki n'Enugwu bụ Callistus Onaga agwala ụmụ Naịjirịa ka ha gosi agbataobi ha ihunanya ma bie ndụ dika ndị otu Kraịst n'oge emume ekeresimesi a.
Achịbishọp Onaga kwupụtara nke a n'Enugwu oge ọ na-ezi ozi Ekeresimesi nke afọ 2019.
Onaga jikwa otu aka ahụ kwuo na ihe ndị mba Amerịka kwuru na a na-emegbu ụfọdụ okpukperechi karịa ibe ha na Naịjirịa bụ eziokwu.
Onaga gbarụrụ ihu ma nye gọọmenti etiti ndụmọdụ ka o were ire ya gụọ eze ya ọnụ wee chekwaa ndụ na akụnaụba ụmụ Naịjirịa karịa isi na mba Amerịka ekwuteghi ya.
O kpere ekpere ka afọ dị mma 2020 karịa nke 2019.