You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2020 Budget: Etu o kwụ n'ihu nke 2019 nakwa etu ọ ga-esi metuta akụnaụba Naịjirịa
Dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari tinyere akwụkwọ mkpata na mmefu nke afọ 2020 n'iwu, otutu ihe dị iche ebutela nrụrịtaụka banyere ya.
Okwu a kpụ n'ọnu bụ ihe gbasara ihe ndị dịka Agụmakwụkwo, nchekwa, ahụike, ịko ubi na ihe ndị ọzọ.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere akụnaụba bụ Davoe Okorie kọwara BBC ụfọdu ihe maka Bọjetị 2020.
Lee ihe na-egosi etu Bojetị 2019 na nke 2020 sị kwụrụ
Okorie kọwara na ọ bụru na ego gọomentị wepụtara maka agụmaakwụkwọ, ahụike, nchekwa na ọrụ ugbo dị obere karịa nke afọ 2019, kedụ zie ihe mere Bọjetị 2020 ji karịa nke 2019?
Ọ kọwara na ọ bụ ụgwọ gọọmentị Naịjirịa chọrọ ikwughachi mere ka ego 2020 ji karịa nke 2019.
Okorie gosikwara na Gọọmentị tụrụ anya na ha ga-akpata ego ga-eru puku nde naịra asatọ dịka ha dere na Bọjetị 2018 kama ọ bụ naanị puku ijeri naịra abụọ ka gọọmentị Naịjirịa kpatara.
Ọ gara n'ihu kọwaa na gọọmentị na-ebite ego iji kwụọ ụgwọ ọnwa na ihe ndị ọzo na-agaghị amịta mkpụrụ a ga-eji kwụghachị ụgwọ.
Ihe ọzọ o kwukwara bụ na ụgwọ "subsidy" gọọmentị na-akwụ na-anapụ ndị Naịjirịa ohere iji nweta ihe dị iche iche ga-eme ka ndụ dị ha mfe.
Kedụ Ihe gọomentị ga-eme ka ihe dị mma
Maazị Okorie sị na gọọmentị ga-eme ụfọdụ ihe ndị a iji mee ka ihe dị mma.
- Gọọmentị wetulata aka n'ego ha na-etinye n'ego enyemaka (subsidy).
- Ka gọọmentị belata etu ha si emefu ego ha ji elekọta ndị n'ọchịchị, Okorie kwuru sị " Ị lee anya ego opeketampe na-esiri anyị ike ịkwu".
- Gọọmentị ga-ejisi ike tinye iwu "Petroluem Downstream Deregulation Bill" nke ga-eme ka ndị ụlọọrụ dị iche iche zụọ ahịa mmanụ agbịdị.
Na nchịkọta, Okorie sị na gọọmentị jisie ike tinye ego na akụnaụba Naịjirịa nke ga-eme ka ọrụ dị mma, were nwaayọ na-emefu ego ka Naịjịrịa nwee ike ikwụ ụgwọ ha ji.