You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
London Bridge Incident: Otu onye anwụọla na mwakpo a
Otu onye anwụọla ebe ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ na mwakpo mere na London Bridge nke mba Briten.
Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na mba ahụ na-eme nyocha akpọọla ya mwakpo otu ndị na-eyi ndụ egwu.
Praịm Minista mba ahụ bụ Boris Johnson ekelela ndị ọrụ gbata gbata maka enyemaka ha ma zigara ndị merụrụ ahụ ozi itiakanobi.
Okporo mmanụ ọhụrụ na-abịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na a ga-ebido ọrụrụ okporo mmanụ agbịdị ga-esi Ajaokuta dị na Kogi steeti rue Kano.
O kwuru nke a n'ọgbakọ mba ndị na-ebupu mmanụ agbidị nke na-eme ugbua n'Equatorial Guinea.
Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a
Akwụkwọ nsọ amachighi 'plastic surgery' - Tony Rapu
Onye ama ama n'atụmatu inyere ndị nwere nsogbu aka bụkwa ukọchukwu bụ Tony Rapu enyerela ndị mmadu ihe ha ga-eji mee mkpọtu na soshal midia
Ụkọchukwu Rapu sị na akwụkwọ nsọ ndị ofufe kraịst akatọghị ndị mmadụ ime ha Bekee kpọrọ "Plastic Surgery".
Mana, ọ sịkwa n'ọbụ mma nke mụọ ka mma.
Rapu sị na ihe mere bụ na o nweghi ihe o chere dị njọ ma mmadụ chọrọ mma maọbu gbanwe onwe ya.
Ọ bụ n'akara Instagram ya ka Ukọchukwu Rapu tinyere okwu a.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a: