You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Butt Implant: 'Achọrọ m ịwepụ otele m gotere egote'
Sophie Elise bụ nwaagbọghọ dị afọ iri abụọ na anọ nwere agba n'ihe onyonyo na Norway ma nwee ndị nkwado puku narị ise n'elu 'Instagram'.
Sophie kọwara na o nwere obere ahụ mana ọ chọro ka e wulite ukwu ya ka ọ dị ka nke 'nwaanyị Owere'.
Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa iwulite otele dị ka ngwaahịa n'Instagram, Sophie graa mba Tọki ịzụta otele nke ya.
O kwuru na ọ na-atụ anya na ọ ga-ada ezigbote ọnụ, mana ha beere ya ezigbo ego nke mere ka obi dị ya mma.
"O bere ego oo, o bere ego karịa ihe ọ kwesịrị ibụ" ka Sophie gwara ndị mgbasa ozi 'Radio 1 Newsbeat'
Gịnị mere ọ ji chọọ ịwepụ ya ugbua?
O kwuru na mgbe a wachara ya otele, na ahụ fụrụ ya ụfụ.
Mgbe na-adịghị anya, ndị mmadụ na Soshal Midịa bidoro kwuwe okwu maka otele ya.
Ndị mmadụ kwuru na otele ọhụrụ ahụ na ahụ ya agakọghị nke ọma.
"Ugbua ka m matara na ọ bụghị ihe m kwesịrị ime. Ihe niile mere m 'vuum' n'anya, ugbua ka m matara na m echeghị ya ọfụma tupu m waa otele m" ka Sophie kwuru.
Sophie tinyere nke a na-etinye etinye akpọro 'Silicone' mana e nwere atụmatụ ọzọ ebe a ga-ewere abụba dị n'ahụ mmadụ were tinye n'otele ka o buo ibu.
Ọ chọpụtala na ahụ ya mara mma ma ghọta na onweghị ihe o ji.
Mana ịwepụ otele ya ugbua nwere 'Kọma'
Sophie mechazịrị chọta onye dọkita na-awa ahụ nke ọma.
Dọkita a kọwaara ya na o nweghị ike ịwepụcha ha niile n'ihi na nke e tinyeere ya bụ nke a na-etinye n'ara.
Ọ gwara Sophie na ihe ga-emebi ma e wepụchaa ha niile n'ike.
Sophie kwuru na ọ ga-arụzi otele ya n'ọdịnihu, mana ka ọ dị ugbua, ọ ga-ewelata ya ka ọ dịkwa ka ihe yiri anụ ahụ mmadụ.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkịrị ga-amasị gị: