Bleaching the skin: Ụzọ ọzọ ndị mmadụ si achọ ịcha ọcha

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nwanne ihe anya hụrụ gbasara ụzọ ọhụrụ ụmụnwaanyị si agbanwe ahụ ha ka ha chaa ọcha dịkwa egwu.

Nke a mere ka ndị mmadụ bido gosiwe mgbagọjụ anya ha maka atụmaatụ a ndị na-eme ya kwuru na ọ nọ ọnụ puku naịra iri atọ.

Lekwa ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

@aquillox kwuru na nke a riri ya ọnụ.

@Jason_Cryptoz kwuru na ahụ mara ya riri mgbe o kiriri atụmaatụ a n'onyonyo na-efegharịnu.

@Amsantiedo kwuru na ndị a egbuo ndị a.

@DohdohChichi kwuru na ọ bụ onye isi oji etu ahụ ya si acha na-amasị mere ihe a.

Lee ụzọ ole na ole ndị mmadụ si eji ude acha ọcha

Dkta Chidinma Gab-Okafor kpọpụtara ụzọ anọ a dịka etu ndị mmadụ si eji awụchapụ elu ahụ ha.

  • Nchagharịtụ(Toning)
  • Isi n'oji fere ọcha(Whitening)
  • I ji ude wepụ pimpụlụ(Clarifying)
  • Nchagharịtụ karịa etu isi achabu(Lightening)

Dkta Gab-Okafor kwuru na nne ji udiri icha ọcha ọbụla bụ ihe bekee kpọrọ Bleaching.

I mana ite ude ga-acha gị ọcha nwereike ị na-agị ịmụ nwa?

Ihe ndị a socha bụrụ ọghọm dị n'ịwụchapụ elu ahụ mmadụ.

  • Ahụ gbagọrọ agbagọ
  • Ngosi eriri ime ahụ (Visble vain)
  • Nje
  • Mmerụ ahụ anaghị ala ala
  • Ihu fanta , ọkpa koku
  • Aka unere amịrị amị
  • Araghụhị ụra ọfụma
  • Ọria akpụ nke elu ahụ
  • O na-emetụta afọ ime

Akụkụ ahụ gị ịwụchapụ elu ahụ nwereike ịla n'iyi

  • Ụbụrụ
  • Umejuanụ
  • Ọbara
  • Elu ahụ
  • Akịrị

Akụkọ ndị ga-amasị gị