Ọ bụ ndị na-azọ onyeisi ọdọụgbọala bara onwe ha ọgụ n'Ebonyi - Uweojii

Loveth Oda bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'ebonyi steeti a katọọla akụkọ kwuru na ndị APC na PDP lụrụ ọgụ n'obodo Agubia dị n'Ikwo.

Kama na ọ bụ ndị na-azọ onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala dị n'obodo ahụ malitere ịlụ ọgụ n'etiti ha.

Ọ gwara BBC Igbo na nke a na-abịa dịka onye jibu ọkwa ahụ gbara arụkwaghịm n'ọrụ, a na-achọzi onye ga-anọchi anya ya.

Ya mere onyeisioche okpuruọchịchị Ikwo họpụtara ndị ga-anọchitu ọkwa a nwa oge nta mana ụfọdụ ndị ntoroọbịa jụrụ ma họpụta ndị nke ha.

Nke a butere ọ gbaghaara n'etiti ha, ịlụ ọgụ nakwa ịkpọ ụlọ na ụgbọala a ọkụ.

Odah sị e merụrụ ọtụtụ ndị ahụ mana o nweghi onye nwụrụ, gbaa ụfọdụ ụgbọala na ụlọ obibi ọkụ.

Odah sị dịka ọ dị ugbua na ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị so mee nke a ma weta udo n'obodo ahụ.

Mana otu onye a kpọrọ gwara BBC Igbo n'ezie na ọ bụ esemokwu onye ga-abụ onyeisioche ọdọụgbọala butere nke ahụ.

O kwuru na ọ bụ otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ itinye ndị nakwa n'isi ọdọụgbọala ahụ.

BBC Igbo gbara mbọ inwete ndị isi otu PDP na APC ịmata uche n'okwu a mana o nwebeghi isi.