You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
NYSC Camp: 'Nwaanyị achọghị iyi 'trouser' ya kwara laa' - General Shuaibu Ibrahim
Iwu 'National Youth Service Corps' gbasara ụdị uwe ndị niile na-efe ala nna ha ga na-eyi agaghị agbanwe bụ ihe Ọchịagha Shuaibu Ibrahim bụ onyeisi ngalaba na-azụ ndị ji otu afọ efe ala Naịjirịa bụ NYSC kwuru maka mmadụ abụọ achụrụ n'Ebonyi.
Ihe e ji chụlaa ụmụagbọghọ abụọ ahụ bụ na ha jụrụ iyi uwe ụkwụ ogologo (trouser) a chinyere ha.
Ha kwuru na okwukwe ha dịka ndị ụka Kraịst megidere nwanyị iyi uwe ụkwụ ogologo.
Ibrahim gwara BBC n'ụbọchị ụka na ọ bụ eziokwu na-achụrụ ha.
Ọ sị na iwu NYSC kwuru hoo haa na onye ọbụla nọ n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha ga-eyi uwe e nyere ya.
"Agbanyeghị ofufe onye, mmadụ niile ga-eyirịrị ihe iwu kwuru."
Iwu NYSC (section 3[8]) kwuru na onye ọbụla dara iwu ahụ ga-aga n'ihu ụlọikpe dị n'ime ogige ahụ. Ọ bụrụ na ikpe mara ya, a ga-achụla ya.
Ibrahim kwukwara na ụmụnwanyị nwere ike mee 'trouser' ha ka o buo ibu, ka ọ ghara igosi akụkụ ahụ ha niile.
Mana ha enweghị ikike ọbụla ịgbanwe ya ka ọ ghọọ uwe ukwu ụmụnwaanyị a kpọrọ 'skirt'.
Mgbe BBC jụrụ Ibrahim gbasara ndị ụka Alakụba na-eyi hijab, o kwuru na nke ahụ agaghị egbochi ha ịsọ ga njem n'ahịrị bụ nke Bekee kpọrọ 'marching'.
Ibrahim kọwara sị: "Ọ bụnadị n'ogige ndịagha Naịjirịa, a naghị eyi 'skirt' eme 'marching'."
Ọ kọwakwara na egwuregwu ndị ọzọ a na-eme n'ime ogige ebe a na-azụ ndị na-efe ala nna ha, abụghị nke e ji 'skirt' eme.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: