You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu: 'Ihe m chọrọ n'aka gọọmentị Naịjirịa'
Akụkọ dị mkpa:
Nnamdi enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ
Onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu enyela gọọmentị Naịjirịa ọnọdụ ọhụrụ ga-eme ka ya na ha nwee mkparịtaụka.
N'ozi si n'aka odeakwukwọ Ipob bụ Emma Powerful pụta, Kanu sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa jiri obi ọcha kpọ ya oku n'obodo ọzọ nakwa n'ihu otu United Nation.
Ọ sị na oku a ga-abụ maka ihiwe mgbe na etu a ga-eji mme ntuliaka nwereonwe ndị Biafra bụ 'Referendum'.
Kanu gara n'ihu kwuo na ihe mere o ji a chọ ebe ọnọdụ dị mma maka mkparịtaụka bụ maka mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ya n'afọ 2017.
Ọ sị na ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa chọrọ ịgba ya ajụjụ, na gara ezite ndị DSS maọbụ ndị uweojii kama izite ndịagha ka e gbuo ya na 2017.
Kanu sị na ugbua nne ya anwụọla, ahụ esichaghị nna ya ike n'ihi mwakpo ndịagha mere n'ụlọ ha.
Ụmụaka a lụnyere dị ka nkụ na Naịjirịa - UNICEF
Ngalaba United Nation na-ahụ maka ụmụaka bụ UNICEF sị na Naịjirịa kachasị nwee ụmụaka a lụnyere di na nwata n'Afrịka.
Ozi ha wepụtara ụnyaahụ na Bauchi Steeti kwuru na ụmụnwaanyị dị nde iri abụọ na atọ na Naịjirịa bụ ndị a lụrụ dị na nwata.
Onaiyekan alaala ezumike nka
Onyeisi ụka Katọlik n'Abuja bụ 'John Cardinal Onaiyekan' alaala ezumike nka.
Iwu ụka Katọlik kwuru na ndị ụkọchukwu ga-ala ezumike nka ma ha gbaa afọ iri asaa na ise.
Onaiyekan gbara afọ iri asaa n'otu n'ọnwa Janụwarị afọ a.
Akwụkwọ ozi si n'aka ndịisi ụka Katọlik n'Abuja kwuru na Pope Francis ahọpụtala Ignatius Kaigama dịka onye ga-anọchị anya Onaiyekan.
Akpabio ọ ga-ahapụzị mịnịsta lagachi ịzọ ọkwa Sịnetọ?
Ụlọikpe mkpesa kagbuola mmeri Chris Ekpeyong meriri Godswill Akpabio n'ịzọ ọkwa sịnetọ ga-anọchịteanya Akwa Ibom West.
Ụlọikpe a nyere iwu ka e megharịa ntuliaka a n'okpuruọchịchị Essien Udim bụ ebe obodo Akpobio dị.
Pati PDP n'Akwa Ibom nabatara ikpe a ma kwuo ha nwere olileanya imeri Akpabio ọzọ.
Dịka ọ dị ugbua Akpabio ji ọkwa mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta. Ajụjụ a bụrụ ma ọ ga-agbahapụ ọkwa mịnịsta zọọ nke sịnetọ?
NYSC achụọla ụmụagbọghọ abụọ n'Ebonyi Steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ngalaba NYSC chụpụrụ ụmụ agbọghọ abụọ bịa iji otu afọ efe ala nna ha n'Ebonyi Steeti.
Akụkọ a sị na ụmụagbọghọ ndị a jụrụ iyi 'Traouser' dịka o megidere okpukperechi ha.
N'ofesi
Onyeisiala mba Bolivia bụ Evo Morales ekwetala na ya ga-akagharị ntuliaka elu ọzọ n'ihi ebubo ndị mbaụwa na-ebo ya na o ji nrụrụaka wee merie ntuliaka nke mbụ e mere n'ọnwa Ọktoba.
Nke a bụ nke ugboro anọ Morales na-azọ ọkwa onyeisiala Bolivia, ọ malitere ịchị mba ahụ n'afọ 2006.
Ọkụ ọhịa egbuola ihe ruru mmadụ atọ ma ma chụsịa ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọ dị n'Ostrelia.
Ndị ọrụ gbatagbata sị na ihe karịrị ire ọkụ otu narị ka na-agba na mpaghara South Wales nakwa Queensland.
N'egwuregwu
Ndị otu egwu bọọlụ Manchester United mere ka ọbụghị ha taa mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ndị Brighton.
Etu ahụ kwa ka Liverpool si merie ndị Manchester City.
Lionel Messi nyere goolu atọ mgbe ndị Barcelona ji ọkpụ goolu anọ asatara otu merie Celta Vigo n'ụbọchị Satọde.
Nke a mere ka Barcelona gbagoro n'elu tebulu 'La Liga'.
Nwafọ mba Briten na-akwụ ọkpọ bụ KSI emeriela ogbo ya nke Amerịka bụ Logan Paul n'asọmpi ọkpọ ha kụrụ na Los Angeles.
N'asọmpi Premier League nke ehihie a Manchester United na Brighton ga adọbiri ya ebe Liverpool na Manchester City ga-ezute ibe ha.
Nkeji
Ihe nkiri ga-amasị gị: