You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Pete Edochie ama eme ejije?
Ndị mmadụ na-adọrịta ụka na soshal midia maka ihe otu nwagbọghọ kpọrọ onwe ya Sugabelly kwuru sị na "Pete Edochie amaghị ka esi eme ejije".
Sugabelly sị na Pete Edochie na-eme naanị otu ụdị ihe nkiri kamgbe ọ malitere ime ejije; na ihe nkiri "abụghị naanị ịtụ ilu".
Okwu ya a gbarụrụ ihu otụtụ mmadụ bụ ndị sị na ọ bụ mkparị ka nwagbọghọ a kparịrị 'odogwu n'ihe nkiri' bụ Pete Edochie.
@EdoFirstLady sị na ọ bụghị ihe ịtụnanya na ndị mmadụ na-atụnyere mmadụ na ibe ya dịka mgbe a sịrị na Beyonce ka Michael Jackson mma n'iti egwu.
@Adunni_Achebe sị na Pete Edochie na-emekarị ihe nkiri ebe ọ bụ Eze apụtaghị na ọ maghị eme ejije.
Ụfọdụ ndị kwenyere n'ihe Sugabelly kwuru;
@lollypeezle sị Pete Edochie metụkwanụ ụdịrị ihe nkiri ọzọ, na ọ bụghị oke ihe ka a na-achọ n'aka ya.
Dịka ịrụrịtaụka na-aga n'ihu, ka anyị lebanye anya na njem Pete Edochie n'ime ihe nkiri;
Ndụ Pete Edochie na njem ime ihe nkiri ya:
- A mụrụ Peter Edochie n'ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị afọ 1947 n'Enugwu Steeti.
- Ọ na-eme ihe nkiri ma bụrụkwa onye na-agbasa ozi.
- Ọ malitere ọrụ mgbasaozi ya n'afọ 1967 n'ụlọọrụ Eastern Nigerian Broadcasting Corporation.
- Ọ na-atara ọzụzụ n'aka ụlọọrụ British Broadcasting Corporation (BBC) na mgbasaozi n'afọ 1980.
- Ọ pụtara ihe n'ime ihe nkiri n'etiti afọ 1980 na 1990 mgbe o sonyere n'ihe nkiri 'Things Fall Apart' ebe a kpọrọ ya 'Okonkwo'.
- Pete Edochie emeela ihe nkiri karịrị 100 ndị gụnyere Igodo, Narrow Escape, End of Money, Oracle na nke nso nso a bụ Lionheart.
- O ritela ihe nturuugo n'ime nkiri dịka 'Industry Merit Award, Lifetime Achievememt Award'.
- N'afọ 2003, gọọmentị Naịjirịa nyere Pete Edochie nkwanye ugwu 'Member of the order of the Niger (MON)'.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ Pete Edochie dịka otu n'ime ndị kachasị eme ihe nkiri n'Afrịka.
Anaghị agụ aha ndị na-emete ọnụ ha n'ejije na Naịjiria nakwa Afrịka ghara ịkpọ aha ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: