Anambra Floods : Idemmiri a akarịala aka anyị - SEMA Anambra steeti

Dịka udu mmiri na akwado ụla, ụfọdụ ndị na-eme njikere maka ide mmiri na-awakpo ha.

Nke a na-abịa dịka ndị Mba Kamerun mepere ọdọ mmiri dam ha nke Lagdo were mee ka mmiri sọfee karịa.

Dika onyeisi ndị ngalaba gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' ( NEMA) nke mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Fred Anusiem gwara BBC na ndị mba Kamerụm agwaghị Naijirịa na ha emepela ọdọmmiri dam ha.

Ọ bụ Adamawa, Taraba, Benue,Kogi, Anambra, Bayelsa,Rivas, Edo na Delta Steeti ka idemmiri a ga-emetụta maka na ha nọ na ikpere mmiri Benue.

Ọ mere ka anyị ghọta na idemmiri a ga-esite Taraba steeti, banye Benue were si Benue gbabanye Lokoja ma gafee Delta, Anambra, Rivers na Bayelsa tụpụ ọ banye oshimiri Atlantik.

O kwukwara na ọ bụ ndị 'State Emergency Management Agency' (SEMA) ka ọ dịrị ikpọpụ ndị obodo ide mmiri a metụtara.

Dịka ọ sị kọwa na ọ bụ ọrụ ha inyere ndị idemmiri a metutara aka ime ka ihe oriri na ihe ndị ọzọ ruo ha aka.

Ihe ndị gbatagbata (SEMA) Anambra steeti nwere ikwu

Onye na-ekwuchitere ndị SEMA Anambra steeti bụ Chukwudi Onyejekwe gwara BBC na Idemiri a erutela 'Anambra East' na 'Anambra west'.

Onyejekwe kwuru na idemmiri a awakpola ebe niile dị na Anambra west.

Dịka o si kwuo, " Ihe a bụ ugboro abụọ idemmiri a na-awakpo mpaghara ndị n'afo a, mana nke abụọ a sitere Kamerun ma na-abịa n'ike n'ike."

O kwuru na ha na-edu ndị idemmiri a metutara agbaga ebe nchekwa.

E be nchekwa ndị a gunyere -

  • Ulọakwụịkwọ Fada Josef
  • Ulọakwụkwọ Premịa
  • Ulọakwụkwọ Saint Augustine
  • Ulọ akwụkwọ Unity Prịmarị, Ọgbaru
  • Sent James Anglịkan Chụch, Ọgbaru

Na ebe ndị ọzọ.

Onyejekwe gwara BBC na nke a akarịala nke gọomenti steeti ga-ebunwu.

Okwuru na ha agwala ngalaba gọọmenti etiti bụ NEMA ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.

Kedu ihe ndị SEMA ga-eme?

Mazi Fred Anusiem kwukwara na ha enwetala ozi ndị SEMA maka Ide mmiri na-awakpo ha n'Anambra steeti.

O kwukwara na ha ezigarala ndi isiọrụ ha ozi ma na-eche ka ha zaghachi ha n'ime abalị ole na-abianụ.

Akụkọ ga-amasị gị