Khafi BBNaịja: Ndị uweojii mba Ingland akpọọla m ka m lọghachị

Nwaada Khafi Kareem nke sonyere n'egwuregwu 'Big Brother Naija' nwere ike ịlaghachi n'ọrụ ya dịka onye uweojii na mba Ịngland.

Khafi gwara ndị ntaakụkọ oge ọ laghachiri UK na ya na ndịisi uweojii 'Scotland Yard' na-akpa nkata.

Ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mba UK tinyere 'Mirror' na 'Daily Mail' depụtara nke a.

Khafi kwuru na ndịisi ụlọọrụ ha na-ajụ ya mgbe ọ ga-alaghachi n'ọrụ.

Cheta na ndị uweojii 'Scotland Yard' gbarụrụ ihu oge a hụrụ Khafi n'egwuregwu BBNaija.

Ha kwuru na ha enyeghị ya ikike isonye na ihe omume ahụ.

Ha kwukwara na ha ga-eleba okwu ahụ anya ma Khafi lọta.

A chụpụrụ Khafi n'ụlọ 'BBNaija' ka egwuregwu ahụ gachara abalị iri asaa na asaa.

Na mkparịta ụka ya na ndị ntaakụkọ, Khafi si na ya amabeghị mgbe ọ ga-alaghachi.

"Mana ọ ga-abụ n'oge na-adịghị anya," dịka o si kwuo.

"A hụrụ m ọrụ ichekwa obodo London n'anya nke ukwuu."

Khafi nọ na Naịjirịa ugbua iji mee emume ncheta ọmụmụ ya.

Taa bụ abalị atọ nke ọnwa Nọvemba ka ọ gbara afọ iri atọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: