Abịa Security: Kedu ndị bụ ndị 'catcham' a na-eze eze n'Aba?

Ụfọdụ ndị bị n'Aba nke dị na Abia Steeti na-ekwu maka ndị ha sị na ha na ndị uweojii na-arụko a kpọrọ ndị 'Catcham'.

Otu onye bị n'Aba gwara BBC na ndị a bụ ndị na-agbara ndị uweojii ama.

Ọ gwara anyị na ihe eji bido kpọwa ha 'catcham' bụ make etu ha na ndị uweojii sị arụkọ.

Ọ kọwara na ha nwere ike bia soro ndị mmadụ nọrọ, mgbe ndị uweojii biara si 'catcham' ha na-anwụchi onye ha chọrọ inwuchi nyefee ndị uweojii.

Ihe ndị otu "Civil Liberties Organisation" nwere ikwu

Onyeisi ndị otu na-ahụ maka ikike dịrị onye bụ 'Civil Liberties Organisation' (CLO) nke Aba bụ Okechukwu Orji gwara ndị BBC ebe ha kwu maka ndị 'catcham'.

Orji kwuru na e nwere ndị dịka ndị 'catcham' n'Aba.

Dịka o siri gwa BBC na ndị a malitere igbara ndị uweojii ama na nzuzo.

Kama ndị mmadụ mechara mara ndị ha bụ.

Orji kwuru na n'ebe dịka 'Overail' n'Aba, ha na akwụ n'okporo ụzọ.

O kwuru na ị hụ mmadụ atọ kwuchiri ụzọ, mmadu abụọ n'ime ha na abụkari ndi 'catcham' ebe otu onye ga-abụ onye uweojii.

Ọrji gwagwara BBC na ndị catcham na anapụ ndị mmadụ ego ma sịkwa na ha na ndị nchekwa ndị ọzọ na-arụkọkwa.

O kwuru na n'Ụmụikaa 'Junction', na ndị 'catcham' na-anata ndị na-akwọ ụgbọla ego ha na-enye ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

Ihe gọọmentị Abia steeti nwere ikwu

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na gọọmentị Abia steeti enwetabeghị mkpesa ọbụla maka nke a.

Ọ kwukwara na ndịuweojii nwere ikike iji ụzọ kwesiri ekwesi were cheekwa obodo.

Ihe ndịuweojii kwuru

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steet bụ Godfrey Ogbonna mana ọzaghị.

Anyị kpọkwara Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abụja mana ọzakwaghị.

Ogbonna azaghachikwaghị ozi anyị zigaara ya n'akara ekwentị.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkịri ga-amasị gi