You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigerian Police: Nyocha onye uweojii tupu o nyocha gị
Ndị uweojii bụ ndị ọrụ nchekwa pụrụiche na-ahụ maka ime udo, nchekwa na nrubeisi n'iwu na-achị obodo.
N'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ha na ndị mmadụ na-enwe mmekọrịta dị icheiche n'oge niile kwa ụbọchị nke mere e ji asị na ''Ndị uweojii bụ enyi gị"
Mana ọtụtụ oge ndị mmadụ na-ahụta mmekọrịta ha na ndị uweojii dịka ihe ịtụ egwu n'ihi etu ụfọdụ n'ime ha ji akpa agwa.
Ọ bụ nke a mere ndị isi ụweojii jiri depụta usoro ndị mmadụ kwesiri ibu n'obi dịka ha na ndị uweojii na-enwe mmekọrịta.
N'ozi a ha wepụtara n'akara twitter ha kwuru na mgbe ọbụla ndị uweojii nwuchiri gị maọbụ kpọọ gị oku, na ọ bụ ohere i nwere iji mara ndị uweojii nke ọma.
Ihe ndị i kwesiri ịma banyere mmekọrịta gị na ndị uweojii
- Were obi ọcha soro ndị uweojii gaa n'ụlọọrụ ha. Nke a na-egosi na onweghi ihe ọbụla ị na-ezo ezo nye ha. Ọ ga-eme ka ha ghara iji aka ike anwụchi gị.
- Abụla ọgbatauhie nye ndị uweojii mgbe ọbụla ha bịara ịnwụchi mmadụ, kpachara anya na onwereike ị maghị ihe onye ahụ mere eji chọrọ ịnwụchi ya.
- Ejila ekwe ntị gị zaa oku ma ọ bụ kpọọ mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi n'oge ha na-anwụchi gị.
- I nwereike ịbuzọ rịọ ka i nyocha onye uweojii ahụ tupu o nyochaa gị, iji kachapụ ụjọ na o nwereike itinyere ihe ọjọọ ga-chịpụta gị ụkwụ n'ama.
- Tupu onye uweojii ahụ a na-enyocha gị, jụọ ya maka akwụkwọ nyere ya ikike inyocha gị bụ 'Search Warrant' na bekee ma burukwa n'obi na ọ bụghị oge niile ka ọ ga-eji ikike a tupu e nyocha gị.
- Were nwayọọ rịọ ndị uweojii ka ị gwa nwanne gị, enyi gị maọbụ ọkaiwu gị ebe ị nọ ma ha nwụchie gị, ka ezinaụlọ gị ghara ị chọ gị achọ.
- Jụọkwa ndị uweojii maka ikike ha nwere iji nwụchie gị nke bụ 'Warrant of Arrest' na bekee. Kama ọ bụghị oge niile ka ha ga-eji nke a dịka iwu jiri kwuo.
- Gbaa mbọ mee ka ndị uweojii mara maka ọnọdụ ahụike gị ma ha nwụchie gị, ka a mara ma ị chọrọ nlekọta ahụike.
- Ihe ndị a na ndị ọzọ ga-enyere ndị mmadụ aka ị mata ikike ha nwere nakwa nke ruru ha mgbe ọbụla ha dabara n'aka ndị uweojii.