No Bra Day: Gini ka ụbọchị a pụtara?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ọ na-ewu n'ebe niile, ọtụtu ndị mmadu nwere nghọtaghịe ihe ụbọchị a bụ maka ya.

Etu ụbọchị a siri Bido

Dịka ndị otu Cancer.ca siri kọwaa, ọ bụ Dọkinta Mitchell Brown bịdoro ụbochị a i ji mepee anya ndị mmadụ maka ihe gbasara ọrịa kansa n'afọ 2011.

Brown kpọrọ ya 'BRA Day' nke pụtara "Breast Reconstruction Awareness Day".

Ebum n'obi Brown bụ ị kụziri ụmụnwaanyị ndị a ga-awa ara maka ọrịa kansa na ha nwere ikike ị sị ka awa ha ara ma meekwa ya ka ọ dị mma .

Nke a ka ndị Bekee na-akpọ 'Reconstructive Surgery'.

Afọ atọ ka ọ were ka emume a gazụọ mba iri atọ.

Ka oge na-aga ka atụghaghịrị aha ụbọchị a site na BRA DAY ọ bụrụzia No BRA Day, nke mere ka ọtụtu ndị mmadụ aghọtaghe ya.

Ọ na eme Nwoke na Nwanyị kama ọkacha eme ụmụnwanyị ebe ihe pekarịrị 1% n'ime ụmụnwaoke (Dika Nna Beyounce Knowles bụ Mathew Knowles) otu narị na-enweta ya.

Otu ihe ikwesiri ime i jị gbochie Kansa Ara

Ịchọpụta n'oge

Enwere ụzọ abụo esi achọpụta ma mmadụ enwere Kansa ara.

  • Nke mbụ bụ i ji aka gị nyọcha ma pịa ara gị

2. Nke abụọ bụ ịga ụlọ ọgwụ ka ha nyocha ara gị

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụbọchị taa

Nwaada a na-akọwa na ọ bụ ụbọchị maka Kansa Ara na ọ bụghị maka ịgba ọtọ

Nwaada a na-egosi ụmụnwanyị etu ha ga-esi nyocha onwe ha maka kansa ara.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe nkịrị ga-amasị gị