Oxfam Report: Ihe karịrị mmadụ nde 94 ahụghị tụtụrụ rachaa na Naịjria

Ụlọọrụ bụ nke anọghị n'okpuru gọọmentị bụ Oxfam International sị na ihe dịka 94,470,535 bụ ogbenye ọnụntụ na Naijirịa.

Nke pụtara na ndị a anaghị enweta ego ruru narị naịra isii na iri asatọ na anọ (N684.00) kwa ụbọchị.

Onyeisi ndị Ọxfam bụ Constant Tchona kwuru nke a ụbọchị Monday n'Abuja na-ọgbakọ ha ji tinye anya ka ọrụ ha sị gaa ha kpọrọ "On the Road To Becoming an Influencing Hub".

Tchona kwuru na ọnụọgụ a dịbụ 91,501,377 n'ọnwa Apreelụ bụ nke mere eji ahụta Naịjirịa ka isi obodo ndị ụbịam dara.

Ọ dị ka nke ahụ ezughị, ya bụ ọgụ nwere 2,969,158 rigo ọzọ n'ọnwa a bụ nke mezuru ya 94,470,535 ọ dị ugbua.

Tchona sị na ọnụọgụ a akarịrị ọnụọgụ mba ụfọdị n'Afrịka dịka Gambia na Cape Verde.

Ọ sị na nke a pụtara na Naijirịa anọghị nso na mmezu Sustainable Development Goals (SDGs) bụ nkwa ndị mba ụwa kwere maka ihe aga eme ka ụwa dị mma.

Dịka "Worldometer " si dee, ọnụọgụ Naịjirịa ugbua dị 200,963,599 nke ga-eme ka ha bụrụ mba kacha n'ụba mmadụ n'afọ 2050.

Tchona sị na gọomentị Niajirịa ma na ya bu nsogbu chere ha n'ihu.

Akụkọ ga-amasị gị