Gọọmentị etiti ekwuola ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee

Gọọmentị Naijiria akwadola iji ihe kariri dọlla nde dọlla narị atọ bụ ego Abacha zuru nke gọọmentị Swiss weghachitere ga-eme.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ego bụ Kemi Adeosun ekwuola na a ga-eji ego ahụ zụọ ndị ụbiam dịka Onyeisiala Buhari kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị.

O kwuru nke a ebe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi na ngwucha nzụkọ ngalaba na-eke ego n'ụwa niile bụ IMF na-aha ịchafụ nke mere n'obodo Washington na Amerịka.

Adeosun sị kwa na-etinyela ego a n'akpa pụrụiche n'ụlọakụ Niajiria a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ iji bido mepụta atụmatụ ndị ga-enyere ndị ogbenye aka.

Na ozi ọ na-agbasa, ọ sị na gọọmentị etiti nwere olileanya na ha mepụta atụmatụ ha bu n'obi, n'ihe ga na-adịri Naịjiria mma.

N'olu ya "Anyị tinye atụmatụ ndị a na mmepụta, akụ na ụba obodo Naịjiria ga-arị elu"