David Cameron ewerela asị ọcha wụkwasa m n'isi - Goodluck Jonathan

Onye bubụ onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akpọla onye bubụ praịm minista mba Briten bụ David Cameron aha na Facebook maka ụgha ọ si na o dere n'akwukwọ o bipụtara ọhụrụ.

Akwụkwọ Maazị Cameron "For the Record" bụ nke o ji kọwa ihe mere n'ọchịchị ya bụ nke bịara na njedebe mgbe ndị sị na ha chọrọ ịpụ na Yurop meriri na ntuliaka e mere n'afọ 2016.

Cameron rituru n'ọkwa makana o so na ndị chọrọ ka ha nọdụ na Yurop.

Ndị odee nyochara akwụkwọ a kọwara na Cameron ji ya kọwa ebumnuche ya n'ihe banyere atụmatu "Brexit" nakwa etu ọchịchị ya siri gaa.

Ka a na-ekwu maka akwụkwọ na mba ofesi, ihe a Jonathan dere n'akara Facebook ya nwereike mee ka akụkọ ya bụrụ okwu akpụ n'ọnụ, ọkachasị etu a Maazị Jonathan si tinye ya ọnụ.

Jonathan sị na akwụkwọ a kwuru na ya na gọọmenti ya tinyere aka na mpụ na nrụrụaka, ma kwukwa na ọ gbajọrọ enyemaka mba Briten chọro inye maka ụmụ Chibok atọọrọ.

Jonathan sị; "Ọ bụghị eziokwu na onwere mgbe Maazi Cameron sị ka ha nyere anyị aka. Edere m akwụkwọ nye ya, Barack Obama, Fancois Hollande na Benjamin Netanyahu ka ha bịa nyere anyị aka gbapụta ụmụ Chibok."

Maka ebubo nrụrụaka ọ sị na-eboro ya, Jonathan sị na nchọpụta ngalaba na-enyocha mpụ a kpọrọ "Transpacency International" n'afọ 2014 gosiri na Naịjirịa ka mma mgbe ahụ rukwa ugbua.

Maazị Jonathan gara n'ihu kwuo na Maazị Cameron na-eburu ya ihu, ma rụtụ aka na onwereike bụrụ makana ya binyere aka n'iwu machiri nwoke ịlụ nwoke ibe ya.

Ọ sị na ọbụghị ya bụ mbụ na-ebo Cameron ebubo maka ụgha di n'akwụkwọ ya nke ọ ga-abụ onye ikpeazu.

Goodluck Jonathan dekwara akwụkwọ nke ya ọ kpọro "My Transition Hours".

Ụfọdụ ndị so ya rụọ ọrụ pụtara gbarụọ ihu na ihe edere maka ha n'ime akwụkwọ ahụ abụghị eziokwu.

Ma mkaparịtụka ya na BBC nwere, Jonathan kwuru maka njem ya na ụmụ Chibok na ndị ọchịchi ofesi a dịka Barack Obama nke Amerịka.

Lee ihe o kwuru.

BBC Igbo gbara mbọ ịnwete ọnụ na-ekwuru Maazị Jonathan bụ Ikechukwu Eze mana ọzaghị ekwneti ya.