Goodluck Jonathan : Saraki na-agbalị n'ọrụ ya n'ulọ omeiwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa a kpọrọ Goodluck Jonathan etoola onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki.

O toro ya maka etu osi achị ụlọomeiwu nke o kwuru na-akwado ndị otu ụlọomeiwu ndị ọzọ.

N'ọnụ ya, ka m were ohere a wee kwuo na ewezuga ụdịrị ọchịchị Saraki wetera n'ụlọomeiwu ebe ahụ karị bụ ebe ngwere na oke ga na-asọ mpi.

O toro ya maka ụzọ pụrụ iche o si wee nye aka chịkọ ụlọomeiwu mgbe ndị DSS wakporo ha.

Ihe ndị a bụ ihe onye mgbasa ozi ụlọ ọrụ Saraki bụ Sanni Onogu depụta n'akwụkwọ o kere ndị mgbasa ozi.

N'otu aka ahụ, Saraki kwuru na ebumnobi ya mgbe ọ gara ịleta Jonathan bụ ka ọ kwanyere ya ugwu ma gwa na ọ bịaghachitela na pati PDP.

Saraki kwuru na ihe na-eme na Naịjirịa ugbua gosiri na onye ọbụla huru obodo a n'anya kwesiri ịjịkọta aka ọnụ iweghachị Naịjirịa n'ụzọ mwulite, akaọcha, nhatanha na ikpe nkwụmọtọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia: