Tiwa Savage na Charles Anazodo: Ihe ekele ji dị mkpa n'ala Igbo

Ebe foto si, Charles Anazodo/Tiwa Savage/Instagram
Charles Anazodo bụ ome ihe onyonyo Nollywood a ma ama bụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua maka ihe o dere na soshal midia.
Anazodo kwuru na Tiwa Savage enweghi nsọpụrụ n'ihi na ọ keleghị ya mgbe ọ hụrụ ya n'otu ụlọọrụ mgbasaozi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Tiwa Savage bụ otiegwu a ma ama sara ya na-ajụ onye ka ọ bụ o jighị ga-ebu ụzọ kelee ya?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe a gara n'etiti ha mere anyị ji na-ajụ: Kedụ uru ekele bara n'ala Igbo?
Otu onye bụ ọkachamara n'omenala Igbo bụ Ositadinma Amakaeze gwara BBC Igbo ihe niile ekele pụtara.
Ekele ọ dị mkpa n'ala Igbo?
Ihe mbụ o kwuru bụ na "ikele mmadụ bụ omenala Igbo, a tụrụ anya na ọ bụ nwata ga-ekele okenye."
O kwuru na ihe ekele dị mkpa n'ihi na ọ bụ ajụjụ ga-enwe asịsị ma nye ohere ịkwu ka ihe siri dịrị gị.
"Ekele bụ ohere ga-ebute mkparịtaụka n'etiti ndị mmadụ" bụ ihe ọzọ o okwuru
Nke a ga-ebute mmekọrịta nke Bekee kpọrọ "Communion" n'Igbo niile nakwa n'Afrịka.
Ihe ọzọ ekele na-egosi bụ obioma ịnwere ebe mmadụ ibe gị no
"Ọ naghị eme ị makwa onye mbụ dịka onye na-eme mpako," ka ọ kọwara.
N'okwu Tiwa Savage na Charles Anazodo, ọ kọwara na ndị a ma ama nwere akparamagwa pụrụiche.
Ọ sị na ọ bụkwa agwa ahụ nwereike ịme ka Tiwa mee ihe o mere n'abụghị ihe o bu n'uche.










