You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
DSS sị m anwala anwa yie uwe Biafra a ọzọ - Chido Onumah
Chido Onumah bụ onye ntaakụkọ kọwara ka ndị Department of State Security (DSS) si nwuchie ya n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja n'ụbọchị Ụka.
Chido gwara BBC na o sị Sweden abata mgbe ndị DSS bịara kpụrụ ya gawa n'ụlọọrụ ha bụ ebe ha gbawara ya ajụjụ ọnụ dị iche iche.
Ọ sị na o yi uwe e dere "We are all Biafrans" mgbe ọ nọ n'ọdọụgbọelu bụ nke ọ malitere iyi kamgbe afọ 2016.
Ọ sị na ha jụrụ ya ebe o sị nweta akwụkwọ ikike ndị Naịjịrịa ebe ọ bụ onye Bịafra ma yiri uwe a e dere "We are all Biafrans".
Mana ọ sara ha na " ya bụ onye Naịjirịa" na uwe o yi bụ maka iji gbasa ozi maka akwụkwọ o dere a kpọrọ "We are all Biafrans".
Onumah sị na ihe nke a pụtara bụ na ndị ọbụla nwere mmekpa ahụ na Naịjịrịa nwere ihe ha na-achọ dịka na ndị Biafra sị nwee nke ha.
Dịka ọ nọchara n'aka ha awa isii ha gwara ya na ha nwetere ozi na ọ nwere ndị sị mba ofesi na-abịa ibute ọgbaaghara na Naịjirịa nke o so n'ime ha.
Ha gwara na ha "achọghizi ka m yie uwe m ahụ ọzọ, na ha ga-ejichi ya".
Mgbe ha mechera, ha gbanwee okwu ha sị na "o nwere ndị chọrọ ịwakpo m na Naịjrịa".
Ha sị na "na ọ bụrụ na m yiri ya bụ uwe ndị ahụ bịa, na ndị Ipob nwere ike ịbịa gbachitere m, mgbe ahụ nsogbu nwere ike ị dapụta".
Ndị DSS ahụ sị na ọ bụ nchekwa ka ha na-echekwa ya ka ndị mmadụ ghara ị merụ ya ahụ.
Ha mechere jichie ya bụ uwe tupu ha ahapụ ya.