Rochas Okorocha: APC agbakụtala m azụ

Owele Rochas Okorocha

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Okorocha na-ebo onye isi oche APC ebubo maka ntuliaka emere n'Imo

Rochas Okorocha akwaala arịrị maka ihe ọ na-agabiga n'otu APC na agbanyeghị nkwado niile o nyerela pati ahụ.

Okorocha gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzde n'Abuja na APC na onyeisioche ha bụ Adams Oshiomhole "agbakọtala ya azụ." na agbanyeghị mbọ ọ gbara ịkwalite pati ahụ n'Imo nakwa ọwụwa anyanwụ.

"A gbara m mbọ ịhụ na Oshiomhole batara n'ọkwa onyeisioche patị anyị, ọ (Oshiomhole) ma nke ahụ"

O kwukwara mwute ya maka etu ihe sị aga na APC ugbua.

Aha onyonyo, Rochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo

"Amaghị m ebe m kwụ akwụ gbasara ọrụ akwụsịrị m n'ike n'ihi o nweghi onye na-agwa m ihe na-aga na APC kemgbe"

Ihe ọzọ Okorocha kwuru bụ na ọ lụrụ ọgụ niile APC nwere n'ọwụwa anyanwụ mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

"Ihe a bụ ihe na-ewute m nke ukwu n'ihi na eche m na anyị niile bụ otu ezinaụlọ na-agba mbọ maka ọganihu ala Naịjirịa" ka o kọwara.

Maka ọdịnihu ya, o kwuru na ọ ka na-eche ihe ọ ga-eme n'ihu ma kwuo na etu ihe si aga, na ọ dị ya ka APC a ga-anwụ ma Onyeisiala Buhari rituo n'ọkwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị