Tekno Arrest: E nwere iwu megidere ekike mmadụ na Naịjirịa ?

Dika ngwa ekike na-agbanwe n'ike n'ike, uwe akpọrọ ihe ọjọọ mgbe gboo bụzị anya bia lere ugbu a .

Okwu maka ekike ziri ezi bidoro rịwa ibe ya elu dịka ihe onyoonyoo gosịrị oti egwu Tekno na ụmụnwanyị yi mbenukwu na-agba egwu n'okporo ụzọ Legọs.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na uwe ụmụnwaanyị na eyi ugbua na atu n'anya, ọkachasị nke a na-egosi n'ihe onyonyo.

BBC gara njem imata mgbe uwe mmadu dara iwu.

Anyi gbara ndị ọkaiwu ajụjụ i mata nke bu eziokwu, ma lee ihe ha zara anyị -

Nwabufo Ikechukwu :

Ọkaiwu Nwabufo Ikechukwu gwara BBC na n'ezie enwere iwu megidere mmadụ iyi akwa na ezighi ezi na iwu Legọs steeti nke dị na "Lagos state Public decency law".

Kama iwu a akọwaghị ụdị uwe na-adabaghị adaba.

Ndị uweojii nwere ikike nke si na "Section 4 of Police act" ime nyocha maka ihe gbasara ekike na ezighi ezi.

Ọ kọwara na ọ bụ onye ọkaikpe ga-ekpebị ma ihe mmadụ yi ọ dara iwu site n'ihe ndị uweojii nyochapụtara.

Ihuoma Ilobinso:

Okaiwu Ihuoma Ilobinso bụ onye nkụzi na Mahadum "University of Lagos" gwara BBC Igbo na onweghị iwu Naịjirịa megidere ekike mmadụ kpọmkwem.

Kama e nwere iwu megidere agwa ezighi ezi nakwa agwa ụfọdụ ruru unyi n'obodo nke Bekee kpọrọ "indecency".

"Ọmụma atụ bụ ngalaba 136 nke 'Criminal Act of Lagos State'".

Mana Ilobinso kwukwara na ọ na-esi ezigbo ike mmadụ imeri udiri ikpe a.

Lee Akụkọ ga-amasị gị :

Lee Ihe Nkịrị ga-amasị gị :