Anambra Chief Judge: Onwuamaegbu abụrụla nwaanyị mbụ bụ Ọkaikpe Ukwu
Akụkọ dị mkpa nke mgbede
Anambara steeti enweela nwanyị mbụ bụ Ọkaikpe ukwu

Ebe foto si, Anambra State Govt.
Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara Steeti eduola Ijem Onwuamaegbu n'iyi ọrụ dịka Ọkaikpe Ukwu nke steeti ahụ
Ọkaikpe Onwuamaegbu bụ onye nwaanyị izizi rigoro n'ọkwa na Anambara.
Govanọ Obianọ duru ya n'iyi ọrọ n'ogige ụlọ gọọmentị nke dị n'Awka taa bụ ụbọchị Monde.
Ọ nọkwara ebe ahụ kwe nkwa ịgbalị ike ya iji hụ na ikpe ziri ezi gbadosiri ike na steeti Anambara.
Ndị uweojii achụọla ndị gara ngagharịiwe ọsọ ụkwụeruala

Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ "Revolution Now" n'ọgbọegwuregwu "National Stadium" dị na Legọs.
Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbakọrọ iso mee ngagharị iwe na mpaghara dị iche iche, ndị nke gbakọtara na Legọs nọ na mbombo ọsọ dịka ndị uweojii na-achụ ha.
Anyị achọghị ịkpa oke agbụrụ n'ala anyị - Trump

Ebe foto si, EPA
Na mba ofesi, Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump etinyela ọnụ n'ogbugbu ndị mmadụ nke mere n'Amerịka n'ụbọchị ụka.
Trump katọrọ ịkpa oke agbụrụ nakwa echiche nke na-ekwu na ndị ọcha ka ndị isi ojii nwee ikike ịnọ n'ụwa.
Ọ gwakwara ndị omeiwu mba Amerịka ka ha mepụta iwu ọhụrụ iji hụ na onye ọbụla gburu ọtụtụ ndị mmadụ nwetara ikpe ọnwụ.
Nke a bụ maka mmadụ abụọ ji egbe gbagbuo ihe ruru mmadụ 31 na steeti Ohio nakwa Texas n'ụbọchị ụka, abalị anọ nke ọnwa Ọgọst.








