Ministerial Screening: Ndị Sineti akwadola nhọpụta a họpụtara mmadụ 43 dịka mịnịsta
Akụkọ dị mkpa 30-7-19:
G
Ndị Sineti akwadola nhọpụta a họpụtara mmadụ 43 dịka mịnịsta

Ebe foto si, Nigeria Senate
Ndị Sineti akwadola nhọpụta a họpụtara mmadụ 43 dịka mịnịsta.
Ha mere nke a n'ụbọchị Tuzde ka ha mechara nnyocha mmadụ iri abụọ na atọ (23) ma hapụ iri abụọ(20) ka ha lawa na agbaghị ha ajụjụ ọbụla.
Cheta n'izuụka gara aga onyeisiala wepụtara aha mmadụ iri anọ na atọ bụ ndị họpụtara ga-eso ya rụọ ọrụ dịka mịnịsta.
Sineti nyochara Lai Mohammed na ndị ọzọ taa

Taa ka o rutere Lai Mohammed onye bụbu mịnista mgbasaozi ime nyocha nke ya n'ụlọ omeiwu ukwu maka ndị a họpụtara ga-eso onyeisiala Buhari arụ ọrụ dịka mịnịsta.
Mana ọtụtụ ndị omeiw si steeti ya bụ Kwara rịọrọ ka a hapụ ya ka ọ lawa na ajụghị ya ajụjụ ọbụla.
Cheta na ndị otu ndọrọndọrọ PDP chọburu ka e ziga aha ndị ahụ na nke ndị EFCC n'ihi na ha sị na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị aka ha adịghị ọcha.
Ikpe El-Zakzaky

Ebe foto si, IMN
Ikpe gbasara ịtọhapụ onyeisi ndị otu Shiite bụ Ibrahim El-Zakzaky ga-ebi n'abalị ise nke ọnwa Ọgọst dịka ụlọikpe ukwu dị na Kaduna si kwuo ụnyahụ.
El-Zakzaky na nwunye ya na-arịọ ụlọikpe ahụ ka o nye ha ikike ịga mba India ga leta ahụike ha anya.
Ụgbọelu dara n'ụlọ

Ebe foto si, AFP
N'ofesi, mmadụ iri na asaa alaala mmụọ dịka obere ụgbọelu ndị agha dara n'ike n'ogbe ebe ndị mmadụ bi na Pakistan.
N'aka nke ọzọ, mmadụ iri ise na asaa nwụrụ n'ọgbaghara daputara n'etiti otu abụọ n'ime ụlọmkpọrọ dị na Para State nke mba Brazil.
Gareth Bale agbaala arụkwaghịm

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Gareth Bale agaghị eso ndị otu Real Madrid gaa mba Germany ebe ha nwere asọmpi enyi na enyi ha ji akwadọ maka mmalite afọ bọọlụ ọhụrụ.
Obi adịghị bale mma n'ihi na Real Madrid gbochiri ya ịga mba China ebe ekwere ya nkwa iji nkata bunye ya ego kwa izu ụka ọbụla.
Nnamdi na-ayọkọ ego maka Biafra

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Nnamdi kanu bụ onyendụ ndị Indigenous People of Biafra, Ipob ehibela ngalaba ọrụ akpọrọ Biafra Aid Foundation bụ nke ọ sị na ọrụ ha ga-enyeaka ị me ka mbọ mnwereonwe Biafra gbapụ ya ọsọ.
Kanu kwuru nke a na njem ya na mba US bụ ebe ọ siri na ụlọọrụ a ga-enyeaka ịhazị ọrụ gbasara mnwere onye Biafra na mba ahụ.
Ọ sị na ụlọọrụ ahụ ga-enwe akara ụlọakụ ebe ndị mnwereonwe Biafra na-echu uchu ga-akwụnye onyinye afọojuju ha kwa ọnwa.
N'akwụkwọ o binyere aka na US, Kanu si na ndị niile mwereonwe Biafra meturu n'obi nwere ike ịkwunye otu dọla kwa ọnwa ruo mgbe ya bụ mnwereonwe ga-abịa na mmezu.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi Ipob bụ Emma Powerful gụpụtara nke a.










