You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu state: Ụmụaka asatọ anwụọla n'ime olulu mmiri
Mmadụ asatọ anwụọla n'ime olulu mmiri n'egwu
Ụmụokorobịa asatọ nwụrụ n'ime welụ n'Igogoro, Enugu-Ezike dị n'okpuruọchịchị Igboeze North, Enugu steeti, ụbọchị Monde, Julaị 22,2019.
Odobeghị anya ihe gburu ha, mana a na-eche na ọ bụ anwụrụọkụ si n'injin ha chọrọ iji mipụta mmiri na ya bụ welụ.
Mmadụ abụọ ọzọ anwụọla na ngagharịiwe ndị Shiite
Ọ ka na-akpọtụ n'Abuja ebe mmadụ abụọ ndị otu shiite nwuru maka ngagharị iwe ha na-eme maka onyeisi ha bụ El-Zakzaky gọọmenti ji.
Onye ndụmọdụ onyeisiala na mgbasa ozi bụ Femi Adesina ekwuola na ihe mere gọọmenti ejibeghị hapụ El-Zakzaky bụ maka na gọọmenti tinyere akwụkwọ ka ekpegharịa ya bụ ikpe.
Boris Johnson eweghaarala Ochịchị mba Briten
N'ofesi, Boris Johnson bụ onye weghaara ọchịchị dịka onyeisiala mba Briten ga-amalite ọrụ ya taa bụ Wenzede.
A tụrụ anya na Johnson ga-akpọpụta ndị ọrụ ya ozugbo ebe Queen Elizabeth nyegoro ya ikike.
Real Madrid emeela Arsenal akpịrị ogologo
Real Madrid ji agba penariti wee merie Arsenal n'asọmpi enyi na enyi ha gbara na mba Amerịka n'abalị Tuuzdee.
Arsenal bụ ụzọ nye goolu abụọ site n'aka Alexandre Lacazette na Pierre-Emerick Aubameyang.
Mana Gareth Bale na Marco Asensio sachara goolu abụọ ahụ n'agba nke abụọ.
Egwuregwu ahụ bara na penariti ebe Real Madrid ji goolu atọ asatara abụọ wee turu ugo.
Subriel Matias etigbuola Maxim Dadashev
N'ewguregwu, otiọkpọ Subriel Matias etigbuola Maxim Dadashev nke Russia n'ọkpọ nke Bekee kpọrọ light-welterweight nke International Boxing Federation akụrụ na Maryland, US.
Odeakwụkwọ IBF bụ Umar Kremlev na-eche na ọ nwere ka Matias siri daa iwu asọmpi ahụ.
N'akụkọ mechara pụta ihe, Dadashev mechara laa mmụọ, site n'ihe mmerụ ahụ o nwetara n'ọkpọ Matias suru ya.
Ọ dị naanị afọ 28 mgbe ọ nwụrụ.