Ministers List: Ihe ndị ị maghị maka ihu ọhụrụ so na ndị mịnịsta

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ahia a na-eche azụọla kama ọ bụghị mmadu niile biara ahia.

Aha ndị mịnịsta ga-eso rụọ ọrụ n'ọchịchị Muhammadu Buhari agba nke abụọ apụtala.

Dịka Buhari kwere nkwa na ya ga-eji aka ya nyoputa ndị tozuru irụ ọrụ, mana n'ime aha ndị a, e nwere naanị ihu ihu ọhụrụ iri na atọ.

Lee ndepụta ndị bụ ihu ọhụrụ nakwa ihe ndị ị maghị maka ha:

Sharon Ikeazor:

Ada Anambra steeti a bụ okaiwurụburu dịka onyeisi 'Pension Transitional Arrangement Directorate (PTAD)'

Lee ihe ndị mmadu kwuru maka nhọpụta a họpụtara ya.

Henry Okelue kwuru na nhọpụta di mma na ekwu kwa na ezigbo ọrụ Sharon Ikeazor rụrụ na PTDA bụ ezigbo ọmụmaatụ.

Femi Fani-Kayode zigara ya ozi ekele na Twitter.

Wale Adetona gosipụtara obi ụtọ ya ma kwuo na ọ ma ọrụ ya.

Uchechukwu Sampson Ogah

Uchechukwu Sampson Ogah bụ nwaafọ Abia steeti ma bụrụ kwa onyeisi ulọ ọrụ nmanụ agbidi bụ 'Master Energy Group' nke nwere ngalaba azumahia ruru iri na ise.

Lee ihe ndị mmadu nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya.

Chukwuemeka Nwajiuba

Nwa afọ Imo steeti bụ okaiwu ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi 'Unitrust Insurance Co. Ltd .

Ọ nọchikwara ndị be ha ugboro abụọ n'Ụlọomeiwu Nta.

@Ekensazubuike kwuru na nhọpụta ya bụ ihe ziri ezi.

Timipre Sylva

Timipre Sylva chibụrụ dịka gọvanọ Bayelsa steeti bido n'afo 2007 na 2008.

Ogedi Festus kelere ya maka nhọpụta a họpụtara ya.

Johnson Collins Ufuoma kwuru na nghoputa a ghọpụtara Timipre Sylva amasighị ya

Godswill Obot Akpabio

Lee ihe ndi mmadu n'ekwu maka nghọpụta aghọpụtara ya -

Emjay Ekanem na-ekele ya

Eleshtalks ruturu aka maka ikpe o chere na ọ nwere

Festus Keyamo, nwaafọ Delta rụrụ ọrụ ka ọnu na-ekwuchitere otu na-ahu maka ndọrọndọrọ ọchichị Muhammadụ Buhari mgbe ọ na-azọ okwa Onyeisiala.

Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka nghọpụta a ghọpụtara ya

Adebayo Bankole Akintunde gosiputara na otụghị anya nghopụta ya

Emmanuel E Uduaghan na-ekele ya

Gbemisola Ruqayyah Saraki

Lee ihe ndị mmadu n'ekwu maka nghọpụta ya

Oluwatobi Akangbe T kwuru na Gbemisola Saraki na-eri elele igba nwanne ya mgba okpuru

Najeebwali kwuru na kpakpando ọhụrụ ebiliela

Rauf Aregbesola

Lee ndị ụgbọ Minista hapụrụ

1) Solomon Dalung

2) Abdulrahaman Dambazau

3) Udo Udoma

4) Isaac Adewole E

5) Okechukwu Enelamah

6) Emmanuel Ibe Kachikwu

7) Mansar Dan Ali

8) Audu Ogbeh

9) Adebayo Shittu

10) Usani Usani

Lee Akụkọ ga-amasị gị