Libya Car bomb blast: Ogbunigwe egbuola mmadụ anọ

Akụkọ dị mkpa

Ogbunigwe na Libya

Ogbunigwe gburu mmadụ anọ na mba Libya taa.

Ogbunigwe gbara na Libya

Ebe foto si, Reuters

Ọtụtụ ndị ọzọ merụkwara ahụ dịka ogbunigwe a dị n'ụgbọala gbapụrụ ebe a gara ili ozu General Khalifa Al-Mismari.

Ogbugbu ndị mmadụ na Saụt Afrịka

Okwu banyere ọnwụ erughi eru ụmụ-afọ Naịjirịa na mba ofesi, ọkachasị Saụt Afịrịka so n'ihe a kpụ n'ọnụ ugbua.

Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Mana onyeisi Ndigbo bi na mba ahụ bụ Udeze Jonas Ezeali kwuru na ọ bụghị na e bu ndị Naijiria n'obi kama na ndị Naijiria ọ metụtarala bụ ihe ndakwasị dakwasịrị ha.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: 'Ogbugbu mmadụ dị elu na Saụt Afrịka'

Ngagharịiwe ndị Shia

Okwu ka na-arị ibe ya elu dịka ndị otu ofufe ndị Alakụba a kpọrọ ndị "Shịa" buuru ngagharịiwe ha merela abalị abụọ n' Abụja gaa na Legọs.

Ndị Shia

Iwe ha bụ na ha chọrọ ka a tọhapụ onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky gọọmenti ji kemgbe afọ 2015.

N'egwuregwu,

Aịvọrị Kost na Ọljiria na-achịpụ ya ugbua dịka Naịjirịa na-eche ịmata onye ha ga-ezute n'ime ha abụọ.

Mahrez na Zaha

Ebe foto si, BBC/Getty Images

Marakwa na Madagascar meriri Naịjirịa na Tunishia ga-apịrị ya mgbe ọ kụrụ elekere asatọ nke abalị Julaị 11.

Tanko Mohammed ga-abz CJN nke ezigbo

Acting CJN Ibrahim Tanko Mohammed

Ebe foto si, Twitter/@NGRPresident

Nkọwa foto, Tanko Mohammed nochiri anya Walter Onnoghen nwa mgbe nta dika ọkaikpe ukwu nke Naijiria

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Ahmad Lawan gụpụtaraozi onyeisial Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari zitere ha sị ka eme Ọkaikpe Tanko Mohammed Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa nke ezigbo.

Mohammed bụ Ọkaikpe Ukwu nke nnọchị anya dịka ọrịgoro ọkwa nwa mbe nta mgbe ọdachị banyere nrụrụaka dakwasịrị Ọkaikpe Walter Onnoghen.

Ọnnoghen mechara laa ezumike nka site na arịrịọ otu jịkọrọ ndị ọkaikpe Bekee kpọrọ "National Judicial Commision" (NJC) rịọrọ.

Mkpebi Onyeisiala Buhari bịara ka NJC enyeRE nkwado ka Onyeisiala Muhammadu Buhari gaa n'ihu họrọ Tanko Mohammed dịka ọkaikpe ukwu nke Naijiria.

NJC nyekwara nkwado ka ahọpụta Ijem Onwuamaegbu na Nwaigwe Anselm dika ọkaikpe ukwu nke Anambra na Ebonyi steeti n'otu n'otu.

Cheta na Buhari họpụtara Tanko Muhammad ka ọ bụrụ ọkaikpe ukwu nwa mgbe nta mgbe ọ chụturu Walter Onnoghen bụ onye jibu ọkwa ahụ na January afọ a.

Mobile phone waste

Ebe foto si, Getty Images

Iji ekwenti gị atụ mgbọ n'ule? Gbadokwa anya gee nti nke mere n' Ibadan Polytechnic bụ ebe ekwentị niile anakọrọ ndị na-agba mgbọ bụzị ihe eji mee nkụ.

Dịka akwụkwọ akụkọ Nigerian Tribune si kwuo, nke ahụ bụ iji gosi njikere mahadum ahụ dị ịkwụsị nrụrụaka ule n'ụdị ọbụla n'ụlọakwụkwọ ha.

Osote onyeisi mahadum ahụ bụ Bayo Oyeleke kwuru, "ụmụakwụkwọ anyị ma na onye ọbụla ji ekwentị bata ebe a na-ele ule ga-ata ahụhụ ya, mana ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ọkpọchị ntị".

"Ya mere anyi ji agba ekwentị ọbụla anyị natara ha n'ime ụlọ ule ọkụ.

Kpachapụ anya ma ị na-aga Saut Afrịka

Uju Ndubisi Chukwu

Ebe foto si, Facebook/Chartered Insurance Institute of Nigeria

Nkọwa foto, Elizabeth Ndubisi Chukwu

Ndị ụlọomeiwu ukwu agwala gọọmentị etiti ka ha maa ọkwa ka ndị mmadụ kpachapụ anya maka ịga mba Saut Afrịka.

Ndị omeiwu nyere ntuziaka a dịka otu onye n'ime ha bụ Enyinnaya Abaribe kwulitere okwu otu nwanyị Naijiria aha ya bụ Elizabeth Ndụbisi-Chukwu bụ onye egburu na mba ahụ n'ọdị nso a.

Mbe korota alaala kpam kpam

Vintage Volkswagen Beetle cars

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A rụpụtara Mbe korota izizi n'afọ 1938

Ọ bịara ije nwe ụla bu egwu a na-agụ n'ụlọọrụ ụgbọala Volkswagen ka ha sị ụgbọala mbe korota nke bụ Beetle na Bekee' jee nke ọma dịka ha kwụsịrị imepụta ya kpam kpam ụnyaahụ.

Arụpụtara mbe korota nke izizi n'afọ 1938, ebe ọchịagha mba Jamanị bu Adolf Hitler bụ onye izizi gbara ya.

Naijiria eturula ugo

Super Eagles meriri ndị Bafana Bafana

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari so ndị Naịjirịa amu paulina paulina ka Super Eagles mmeriri Saut Afrịka ụnyaahụ.

Buhari si ha jide ka ha ji n'ihi na ọ fọla naanị asọmpi abụọ ka ha maburu iko mba Afrịka lọta.

Mba Senegal dọkatakwara mmerị iji gafee ụnyaahụ.

Gee nkeji a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri anyị nke taa:

Aha onyonyo, Ịkpa akwa Akwete

Akụkọ ga-amasị gị: