AFCON Round of 16: Benin Republic emeela Morroco akwụrụ echewe ụwa

Ebe foto si, Twittwr/CAF
Igbo tụrụ ilu sị na elelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ, nke a bụ eziokwu.
Mba Morocco ji anya ha wee hụ nke a taa dịka mba Benin Republic gbaara ha ụgbọnwamkpi n'asọmpi iko mba Afrịka bụ AFCON 2019.
Morocco na Benin Repụblic nyere onwe ha otu goolu otu goolu nke mere ka asọmpi ahụ baa na penariti.
Ndị Benin Republic dị naanị mmadụ iri wee gbachaa ya bụ bọọlụ n'ihi 'Red card' e nyere otu n'ime ha.

Ebe foto si, Twitter/CAF
Penariti ahụ mechara bie mgbe Benin Republic nyere Morocco goolu anọ asatara naanị otu.
Nke a pụtara na Benin agafeela na agba nke ọzọ AFCON 2019 ebe Morocco eberela akwa lawa. Ọ bụ nke izizi Benin Republic na-abanye agba nke atọ AFCON.
Ka ọ dị ugbua, mba Senegal na ndị Uganda na-achịpụ ya iji mara onye ga-agafe na agba nke ọzọ.
Ndị Super Eagles nke Naijiria ga-ezute mba Cameroon echi bụ Satọdee n'elekere ise nke uhuruchi.
Akụkọ ga-amasị gị:









